Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 34:9-16 Bible Nso (IGBOB)

9. Ha we biakute Hilkaia, bú onye-isi-nchu-àjà, nye ya ego ahu nke anēwebata n'ulo Chineke, nke ndi Livai, bú ndi nēche nbata-uzọ, chikọtara n'aka ndi Manase na Efraim, na n'aka ndi nile fọduru nke Israel, na n'aka Juda na Benjamin nile na ndi bi na Jerusalem.

10. Ha we nye ya n'aka ndi nēje ozi ahu, bú ndi nēlekọta ihe n'ulo Jehova; ndi nēje ozi ahu, bú ndi nālu ọlu n'ulo Jehova, we nye ya iji mezi ebe etipúru etipú na ime ka ulo ahu di ike;

11. ha we nye ya ndi-ọ̀kà n'osisi, nye kwa ndi nēwu ulo, iji zuta nkume awara awa, na osisi iji me ihe-njikọta, na ijikọta ulo nile nke ndi-eze Juda bibiri.

12. Ndikom ahu nālu ọlu n'ikwesi-ntukwasi-obi n'ozi ahu: ndi-nlekọta-ha bu kwa Jahat na Obadaia, ndi Livai, ndi sitere n'umu Merari; na Zekaraia na Meshulam, ndi sitere n'umu ndi Kohat, ibu ndi-isi: na ndi Livai ọzọ, bú ndi nile nwere nghọta n'ihe abù.

13. Ha bu kwa ndi-isi nke ndi-ibu, ha nēdu kwa ndi nile nēje ozi ifè òfùfè ọ bula: ufọdu nime ndi Livai bu kwa ndi-ode-akwukwọ, na ndi-odozi-okwu, na ndi-ọnu-ama.

14. Ma mb͕e ha nēweputa ego ahu nke anēwebata n'ulo Jehova, Hilkaia, bú onye-nchu-àjà, chọtara akwukwọ iwu Jehova nke enyere site n'aka Moses.

15. Hilkaia we za, si Shefan, bú ode-akwukwọ, Achọtawom akwukwọ iwu ahu n'ulo Jehova. Hilkaia we nye Shefan akwukwọ ahu.

16. Shefan we būru akwukwọ ahu biakute eze, ọzọ kwa, o weghachiri eze okwu, si, Ihe nile enyere n'aka ndi-orù-gi, ha nēme ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ihe Emere 34