Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 34:26-33 Bible Nso (IGBOB)

26. Ma eze Juda, onye nēzite unu iju Jehova ase, otú a ka unu gāsi ya, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri: Okwu ndia nke i nuworo,

27. n'ihi na obi-gi di nrò, i we ruru ala n'iru Chineke, mb͕e i nuru okwu-Ya nile megide ebe a, megide kwa ndi bi nime ya, i we ruru ala n'irum, dọwa kwa uwe-gi nile, kwa ákwá n'irum; Mu onwem anuwo kwa, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

28. Le, M'gāchikọta gi na nna-gi-hà n'ala-mọ, agāchikọta kwa gi na ndi ọzọ je n'ílì-gi n'udo, anya-gi agaghi-ele kwa ihe ọjọ a nile nke Mu onwem nēme ka ọ biakwasi ebe a, biakwasi kwa ndi bi nime ya. Ha we weghachiri eze okwu.

29. Eze we ziga, chikọta ndi-okenye nile nke Juda na Jerusalem.

30. Eze we rigorue ulo Jehova, ya na ndikom nile nke Juda, na ndi bi na Jerusalem, na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na ndi Juda nile, site n'onye uku we rue onye ntà; o we gua na nti-ha okwu nile nke akwukwọ ọb͕ub͕a-ndu ahu nke achọtaworo n'ulo Jehova.

31. Eze we guzo n'ọnọdu-ya, b͕a ndu n'iru Jehova, ijeso Jehova, na iwere obi-ya nile na nkpuru-obi-ya nile debe ihe nile O nyere n'iwu, na ihe-àmà-Ya nile, na ukpuru-Ya nile, ime okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu nka nke edeworo n'akwukwọ a.

32. O we me onye ọ bula ahuru na Jerusalem na Benjamin ka o guzo. Ndi bi na Jerusalem we me dika ọb͕ub͕a-ndu Chineke si di, bú Chineke nke ndi bu nna-ha.

33. Josaia we si n'ala nile nke umu Israel nwere wezuga ihe-árú nile, me ndi nile ahuru n'Israel ka ha fè òfùfè, ọbuná ifè Jehova, bú Chineke-ha, òfùfè. Ubọchi-ya nile ha esighi n'iso Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, wezuga onwe-ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ihe Emere 34