Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 34:1-11 Bible Nso (IGBOB)

1. Josaia b͕ara arọ asatọ mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze orú arọ na iri na otù nime Jerusalem.

2. O me ihe ziri ezi n'anya Jehova, je ije n'uzọ nile nke Devid nna-ya, o wezugaghi kwa onwe-ya n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe.

3. Ma n'arọ nke-asatọ nke ọ bu eze, mb͕e ya onwe-ya nọ na nwata, ọ malitere ichọ Chineke nke Devid nna-ya: n'arọ nke-iri-na-abua ka ọ malite-kwa-ra ime Juda na Jerusalem ka ha di ọcha pua n'ebe di elu nile, na Asherim, na arusi nile apiri api, na arusi nile awuru awu.

4. Ha we kwatue ebe-ichu-àjà Bealim n'iru ya; o b͕utue arusi-anyanwu nile, nke di n'ebe di elu n'elu ugwu; o tipia-kwa-ra Asherim, na arusi nile apiri api, na arusi nile awuru awu, ọ supia ha, fesa n'elu ílì ndi nāchuru ha àjà.

5. O sure ọkpukpu nke ndi-nchu-àjà n'elu ebe-ichu-àjà-ha, me ka Juda na Jerusalem di ọcha.

6. O me-kwa-ra otú a n'obodo nile nke Manase na Efraim na Simeon, we rue Naftali, nime nkpọnkpọ-ebe-ha nile buruburu.

7. Ọ kwatue ebe-ichu-àjà nile, tipia Asherim na arusi nile apiri api, ha we ghọ uzuzu, o b͕utu-kwa-ra arusi-anyanwu nile n'ala Israel nile, we lata na Jerusalem.

8. Ma n'arọ nke-iri-asatọ nke ọ bu eze, mb͕e ọ mesiri ka ala-ya na ulo ahu di ọcha, o zigara Shefan nwa Azalia, na Maaseia, bú onye-isi obodo ahu, na Joa nwa Joahaz, bú onye-ncheta, ime ulo Jehova, bú Chineke, ka ọ di ike.

9. Ha we biakute Hilkaia, bú onye-isi-nchu-àjà, nye ya ego ahu nke anēwebata n'ulo Chineke, nke ndi Livai, bú ndi nēche nbata-uzọ, chikọtara n'aka ndi Manase na Efraim, na n'aka ndi nile fọduru nke Israel, na n'aka Juda na Benjamin nile na ndi bi na Jerusalem.

10. Ha we nye ya n'aka ndi nēje ozi ahu, bú ndi nēlekọta ihe n'ulo Jehova; ndi nēje ozi ahu, bú ndi nālu ọlu n'ulo Jehova, we nye ya iji mezi ebe etipúru etipú na ime ka ulo ahu di ike;

11. ha we nye ya ndi-ọ̀kà n'osisi, nye kwa ndi nēwu ulo, iji zuta nkume awara awa, na osisi iji me ihe-njikọta, na ijikọta ulo nile nke ndi-eze Juda bibiri.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ihe Emere 34