Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 33:12-25 Bible Nso (IGBOB)

12. Ma mbe anākpab͕u ya, ọ chọ ka iru Jehova, bú Chineke-ya, dajua, we ruru ala nke-uku n'iru Chineke nke nna-ya-hà.

13. O we kpere Ya; O we kwe ka ọ riọta ihe ọ riọrọ, we nuru aririọ-amara-ya, me ka ọ lata na Jerusalem ba n'ala-eze-ya. Manase we mara na Jehova, Ya onwe-ya, bu Chineke.

14. Mb͕e ihe ndia gasiri, o wuere obodo Devid mb͕idi n'azu mb͕idi-ya, n'akuku Ọdida-anyanwu nke Gaihon, nime ndagwurugwu, we rue nbata n'ọnu-uzọ-ama azù; ọ b͕a kwa Ofel buruburu, me ka ọ di elu nke-uku: o do-kwa-ra ndi-isi usu-ndi-agha n'obodo nile ewusiri ike nime Juda.

15. O wezuga-kwa-ra chi nile nke ala ọzọ, si kwa n'ulo Jehova wezuga oyiyi-ihe ahu, ya na ebe-ichu-àjà nile nke o wuru n'ugwu ulo Jehova, na nime Jerusalem, o kpofue ha n'azu obodo.

16. O wue ebe-ichu-àjà Jehova, chua n'elu ya àjà, bú àjà-udo na àjà-ekele, ọ si Juda ka ha fè Jehova, bú Chineke Israel, òfùfè.

17. Otú ọ di, ndi Juda nọ nāchu àjà n'ebe di elu nile, ma ọ bu nání nye Jehova, bú Chineke-ha.

18. Ma ihe nile Manase mere nke fọduru, na ekpere-ya o kpere Chineke-ya, na okwu nile nke ndi-ọhu-uzọ, bú ndi gwara ya okwu n'aha Jehova, bú Chineke Israel, le, edewo ha n'akwukwọ ihe ndi-eze Israel mere.

19. Ekpere-ya kwa, na otú ekwere ka ọ riọta ìhe, na nmehie-ya nile, na nmekpu-ya, na ebe nile nke o wuru ebe di elu nime ha, guzo kwa Asherim na arusi apiri api, tutu o ruru ala: le, edewo ha n'akwukwọ okwu Hozai.

20. Manase we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, ha we lìe ya, n'ulo-ya: Emon nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.

21. Emon b͕ara orú arọ na abua mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze arọ abua nime Jerusalem.

22. O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, dika Manase, bú nna-ya, mere: Emon we chuara arusi nile apiri api, bú nke Manase nna-ya mere, àjà, we fè ha òfùfè.

23. Ma o rurughi ala n'iru Jehova, dika Manase, bú nna-ya, ruru ala; kama Emon nka mere ka ikpe ma ya ri nne.

24. Ndi-orù-ya we kekọta onwe-ha imegide ya, ha we me ka ọ nwua n'ulo-ya.

25. Ndi ala ahu we tib͕ue ndi nile nēkekọta onwe-ha imegide eze, bú Emon: ndi ala ahu we me Josaia nwa-ya eze n'ọnọdu ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ihe Emere 33