Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 31:4-9 Bible Nso (IGBOB)

4. O we si ndi Juda, bú ndi bi na Jerusalem, ka ha nye òkè ndi-nchu-àjà na ndi Livai, ka ha we di ike n'iwu Jehova.

5. Ma mb͕e ekwusara okwu ahu, umu Israel nyere nkpuru mbu nke ọka, na nke manya-vine ọhu, na nke manu, na nke manu-aṅu, na nke ihe-ọmume nile nke ubi, n'uba; otù uzọ n'uzọ iri nke ihe nile ka ha bubatara n'uba.

6. Umu Israel na Juda, ndi bi n'obodo Juda nile, ndi ahu bubata-kwa-ra otù uzọ n'uzọ iri nke ìgwè ehi na ìgwè ewu na aturu, na otù uzọ n'uzọ iri nke ihe nsọ nke edoro nsọ nye Jehova, bú Chineke-ha, ha we tinye aha n'obo n'obo.

7. N'ọnwa nke-atọ ka ha malitere itọ ntọ-ala nke obo ahu, n'ọnwa nke-asa ka ha tubìri ha.

8. Hezekaia na ndi-isi we bia hu obo nile, gọzie Jehova, na ndi-Ya, bú Israel.

9. Hezekaia we jua ndi-nchu-àjà na ndi Livai ajuju bayere obo ahu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ihe Emere 31