isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 31 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma mb͕e emere ka ihe a nile gwusia, Israel nile ndi ahuru n'ebe ahu puru jerue obodo nile nke Juda, titue ogidi nile, b͕utu kwa Asherim, kwatu kwa ebe di elu nile na ebe-ichu-àjà nile, me ka ha pua na Juda na Benjamin nile, n'Efraim kwa na Manase, rue mb͕e emere ka ha gwusia. Umu Israel nile we laghachi, nwoke ọ bula n'ihe-onwunwe-ya, rue obodo-ha.

2. Hezekaia we guzo òkè nile nke ndi-nchu-àjà na ndi Livai, dika òkè nile ha si di, nwoke ọ bula dika òfùfè-ya si di, ma ndi-nchu-àjà ma ndi Livai, ichu àjà-nsure-ọku na àjà-udo, ije ozi, na ikele ekele, na ito Chineke n'ọnu-uzọ-ama nile nke ọmuma-ulo-ikwū Jehova.

3. O guzo-kwa-ra òkè eze sitere n'àkù-ya iji chu àjà-nsure-ọku, bú àjà-nsure-ọku nke ututu na nke anyasi, na àjà-nsure-ọku anāchu n'ubọchi-izu-ike nile, na nke anāchu n'ọnwa ọhu nile, na nke anāchu na mb͕e nile akara àkà, dika edeworo ya n'iwu Jehova.

4. O we si ndi Juda, bú ndi bi na Jerusalem, ka ha nye òkè ndi-nchu-àjà na ndi Livai, ka ha we di ike n'iwu Jehova.

5. Ma mb͕e ekwusara okwu ahu, umu Israel nyere nkpuru mbu nke ọka, na nke manya-vine ọhu, na nke manu, na nke manu-aṅu, na nke ihe-ọmume nile nke ubi, n'uba; otù uzọ n'uzọ iri nke ihe nile ka ha bubatara n'uba.

6. Umu Israel na Juda, ndi bi n'obodo Juda nile, ndi ahu bubata-kwa-ra otù uzọ n'uzọ iri nke ìgwè ehi na ìgwè ewu na aturu, na otù uzọ n'uzọ iri nke ihe nsọ nke edoro nsọ nye Jehova, bú Chineke-ha, ha we tinye aha n'obo n'obo.

7. N'ọnwa nke-atọ ka ha malitere itọ ntọ-ala nke obo ahu, n'ọnwa nke-asa ka ha tubìri ha.

8. Hezekaia na ndi-isi we bia hu obo nile, gọzie Jehova, na ndi-Ya, bú Israel.

9. Hezekaia we jua ndi-nchu-àjà na ndi Livai ajuju bayere obo ahu.

10. Azaraia, bú onye-isi-nchu-àjà, nke ulo Zedok, we gwa ya, si, Site na mb͕e ha malitere ibubata àjà-nbuli n'ulo Jehova, ayi erijuwo afọ, rifọ kwa ihe n'uba: n'ihi na Jehova agọziwo ndi-Ya; ma nke fọduru bu ọtutu ihe nile a.

11. Hezekaia we si ka edozie ime-ulo n'ulo Jehova; ha we dozie.

12. Ha we bubata àjà-nbuli, na otù uzọ n'uzọ iri, na ihe nsọ nile, n'ikwesi-ntukwasi-obi: ma otù onye-ndú nāchi ha bu Konanaia onye Livai, Shimai nwa-nne-ya bu kwa nke-abua.

13. Na Jehiel, na Azazaia, na Nehat, na Asahel, na Jerimot, na Jozabad, na Eliel, na Ismakia, na Mehat, na Benaia, bú ndi-nlekọta n'okpuru aka Konanaia na Shimai nwa-nne-ya, site n'otú Hezekaia, bú eze, na Azaraia, bú onye-ndú ulo Chineke, mere ha ndi-nlekọta.

14. Kore nwa Imna, bú onye Livai, onye-ọnu-uzọ-ama n'akuku ọwuwa-anyanwu, bu onye-isi onyinye-afọ-ofufo Chineke, inye àjà-nbuli Jehova na ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile.

15. Iden, na Miniamin, na Jeshua, na Shemaia, na Amaraia, na Shekanaia, nọ kwa n'aka-ya, n'obodo ndi-nchu-àjà, n'ọnọdu-ha, bú nke ndi kwesiri ntukwasi-obi, inye umu-nne-ha ihe n'òkè, bú inye onye ntà otú anēnye onye uku:

16. nāgughi ndi di n'akwukwọ-osuso-ọmumu-ha nke ndikom, site na ndi b͕ara arọ atọ we ga n'iru, bú onye ọ bula nke nābà n'ulo Jehova, ilu ọlu ubọchi n'ubọchi-ya, ifè òfùfè-ha n'ihe-ndebe nile ha dika òkè nile ha si di;

17. na ndi di n'akwukwọ-osuso-ọmumu nke ndi-nchu-àjà dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, na ndi Livai site na ndi b͕ara orú arọ we ga n'iru, n'ihe-ndebe nile ha n'òkè nile ha;

18. na ndi di n'akwukwọ-osuso-ọmumu n'etiti umu-ntakiri-ha nile, na ndinyom-ha, na umu-ha ndikom, na umu-ha ndinyom, nime nkpọkọta Israel nile: n'ihi na n'ọnọdu-ha, bú nke ndi kwesiri ntukwasi-obi, ka ha doro onwe-ha nsọ n'idi-nsọ:

19. umu Eron kwa, bú ndi-nchu-àjà, ndi nọ n'ọhia nke ebe-ita-nri obodo-ha, n'obodo nile ọ bula, ha nwere ndikom ndi akpọrọ n'aha n'aha, inye ndikom nile n'etiti ndi-nchu-àjà òkè-ha, inye kwa ndi nile ndi di n'akwụkwọ-osuso-ọmumu n'etiti ndi Livai.

20. Hezekaia we me otú a nime Juda nile; o we me ezi ihe na nke ziri ezi na ezi-okwu n'iru Jehova, bú Chineke-ya.

21. Ma n'ọlu ọ bula nke ọ malitere n'òfùfè nke ulo Chineke, na n'iwu, na n'ihe nile enyere n'iwu, ichọ Chineke, ọ bu obi-ya nile ka o ji me ya, ihe we gara ya nke-ọma.