Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 30:5-16 Bible Nso (IGBOB)

5. Ha we guzo okwu a, ikwusa n'Israel nile, site na Bia-sheba we rue Dan, ka ha bia imere Jehova, bú Chineke Israel, ememe ngabiga nime Jerusalem: n'ihi na ha emeghi ya dika edeworo ya n'akwukwọ n'ọtutu mb͕e gara aga.

6. Ndi-ọb͕a-ọsọ we were akwukwọ-ozi sitere n'aka eze na ndi-isi-ya jeghari n'Israel na Juda nile, na dika ihe eze nyere n'iwu si di, si, Umu Israel, laghachikutenu Jehova, bú Chineke Abraham na Aisak na Israel, ka O we laghachikuru ndi b͕apuru ab͕apu ndi fọduru unu site n'aka ndi-eze Asiria.

7. Unu adi-kwa-la ka nna-unu-hà, na dika umu-nne-unu, ndi mekpuru emekpu megide Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, O we rara ha nye ibu ihe-iju-anya, dika unu onwe-unu nāhu.

8. Ub͕u a unu ekwesila olu-unu ike, dika nna-unu-hà mere; ma nyenu Jehova aka-unu, ba n'ebe nsọ Ya, nke O doworo nsọ rue mb͕e ebighi-ebi, fè-kwa-nu Jehova, bú Chineke-unu, òfùfè, ka iwe-Ya nke di ọku we si n'ebe unu nọ chigharia.

9. N'ihi na asi na unu alaghachikute Jehova, agēnwe obi-ebere n'aru umu-nne-unu na umu-unu n'iru ndi adọtara ha n'agha, ha gābiaghachi kwa n'ala nka: n'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, nēme amara, nwe kwa obi-ebere, Ọ gaghi-esi kwa n'ebe unu nọ wezuga iru-Ya, ọ buru na unu alaghachikute Ya.

10. Ndi-ọb͕a-ọsọ ahu we nāgabiga site n'obodo rue obodo n'ala Efraim na Manase, we rue Zebulun: ha we nāchì ha ọchì, lelì kwa ha anya.

11. Otú ọ di, ndikom ufọdu ndi sitere n'Asha na Manase, site kwa na Zebulun, ruru ala, we bia Jerusalem.

12. Aka Chineke di kwa na Juda inye ha otù obi, ime ihe eze na ndi-isi nyere n'iwu site n'okwu Jehova.

13. Ewe chikọta ndi bara uba nime Jerusalem ime ememe achicha ekoghi-eko n'ọnwa nke-abua, bú nkpọkọta bara uba nke-uku.

14. Ha we bilie wezuga ebe-ichu-àjà nile nke di na Jerusalem, ha wezuga-kwa-ra ebe nile nke isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, ha we kpofue ha nime miri-iyi Kidron.

15. Ha we b͕ue anu ngabiga n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa nke-abua: ma ihere mere ndi-nchu-àjà na ndi Livai, ha we do onwe-ha nsọ, webata àjà-nsure-ọku n'ulo Jehova.

16. Ha we guzo n'ebe-nguzo-ha, dika ikpé-ha si di, dika iwu Moses, bú onye nke Chineke, si di: ndi-nchu-àjà nāwusa ọbara nke ha natara n'aka ndi Livai.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ihe Emere 30