Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 24:19-27 Bible Nso (IGBOB)

19. O zite ndi-amuma n'etiti ha, ime ka ha laghachikute Jehova; ha we b͕a àmà megide ha: ma ha aṅaghi nti.

20. Mọ Chineke we were Zekaraia nwa Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, kpuchie Onwe-ya dika uwe; o we guzo n'elu n'ebe ndi Juda nọ, si ha, Otù a ka Chineke siri; N'ihi gini ka unu onwe-unu nāgabiga ihe nile Jehova nyere n'iwu, ihe we ghara igara unu nke-ọma? n'ihi na unu arapuwo Jehova, Ọ rapuwo kwa unu.

21. Ha we kekọta onwe-ha imegide ya, were nkume tub͕ue ya, n'ihi ihe eze nyere n'iwu, n'ogige ulo Jehova.

22. Joash, bú eze, echetaghi kwa ebere nke Jehoiada, bú nna-ya, mere ya, o we b͕ue nwa-ya. Ma mb͕e ọ nwuru, ọ si, Ka Jehova hu ya, ju ase.

23. O rue, n'ọb͕ub͕a arọ, na usu-ndi-agha Siria rigoro imegide ya: ha we biarue Juda na Jerusalem, bilie ndi-isi nile nke ndi Juda site n'etiti ndi ahu, ha we zigara eze Damaskọs ihe-nkwata-ha nile.

24. N'ihi na usu-ndi-agha Siria chiri ndikom ole-na-ole bia; Jehova we nye usu-ndi-agha bara uba nke-uku n'aka-ha, n'ihi na ha rapuru Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha. Ha we me Joash ihe nile ekpere n'ikpe.

25. Ma mb͕e ha siri n'ebe ọ nọ la, (n'ihi na ha rapuru ya n'ọtutu ọria,) ndi-orù-ya kekọtara onwe-ha imegide ya n'ihi ọbara umu Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, b͕ue ya n'elu ihe-ndina-ya, o we nwua: ha we lìe ya n'obodo Devid, ma ha elìghi ya n'ílì ndi-eze.

26. Ma ndia bu ndi nēkekọta onwe-ha imegide ya; bú Zabad nwa Shimeat nwayi Amon, na Jehozabad nwa Shimrit nwayi Moab.

27. Ma ihe bayere umu-ya ndikom, na iba-uba nke ibu eboro ya, na ntọ-ala ulo Chineke, le, edewo ha n'akukọ akwukwọ ndi-eze. Amazaia nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ihe Emere 24