Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 23:11-21 Bible Nso (IGBOB)

11. Ha we me ka nwa eze puta, ha we kpube ya okpu-eze, nye ya ihe-àmà, me ya eze: Jehoiada na umu-ya ndikom we te ya manu; ha we si, Ka eze di ndu.

12. Atalaia we nu olu ndi Juda ka ha nāb͕a ọsọ nēto kwa eze, o we biakute ndi ahu n'ulo Jehova:

13. ọ hu, ma, le, eze nēguzo n'akuku ogidi-ya na nbata, ndi-isi na opì-ha di kwa n'akuku eze; ndi nile nke ala ahu ṅuri-kwa-ra ọṅu, fùa opì; ndi-ọbù-abù ji kwa ihe abù kpọ, ndi nēme ka amara ito otuto nọ kwa. Atalaia we dọwa uwe-ya nile, si, Nkekọta imegide eze, nkekọta imegide eze.

14. Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, we me ka ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise puta, bú ndi-nlekọta usu-ndi-agha, si ha, Menu ka ọ pua ba n'etiti ariri; ma onye nābiaso ya n'azu, ka ewere mma-agha me ka ọ nwua:n'ihi na onye-nchu-àjà siri, Unu emela ka ọ nwua n'ulo Jehova.

15. Ha we doro ya onwe-ha n'akuku abua; o we ba na nbata nke ọnu-uzọ-ama inyinya n'ulo eze: ha we me ka ọ nwua n'ebe ahu.

16. Jehoiada we me ọb͕ub͕a-ndu nke di n'etiti ya na ndi Juda nile na eze, na ha gābu ndi Jehova nwere.

17. Ndi Juda nile we ba n'ulo Beal, kwatue ya, tupia ebe-ichu-àjà-ya nile na onyinyo-ya nile, ha b͕u-kwa-ra Matan, bú onye-nchu-àjà Beal, n'iru ebe-ichu-àjà ahu.

18. Jehoiada we tiye nlekọta nile nke ulo Jehova n'aka ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, ndi Devid kère n'òkè ibu ndi-isi ulo Jehova, isure àjà-nsure-ọku nile nke Jehova, dika edeworo ya n'iwu Moses, n'ọṅù, na n'ibù-abù, site n'aka Devid.

19. O we guzo ndi-ọnu-uzọ-ama n'ọnu-uzọ-ama nile nke ulo Jehova, ka onye ruru árú n'uzọ ọ bula we ghara ibà nime.

20. O we chiri ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise, na ndi di ike nke-uku, na ndi nāchi achi n'etiti ndi Juda, na ndi nile nke ala ahu, me ka eze si n'ulo Jehova rida: ha we si n'etiti ọnu-uzọ-ama nke di n'elu ba n'ulo eze, me ka eze nọkwasi n'oche-eze nke ala-eze.

21. Ndi nile nke ala ahu we ṅuria ọṅu, obodo ahu di-kwa-ra jū: ha we were mma-agha me ka Atalaia nwua.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ihe Emere 23