Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 23:1-15 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma n'arọ nke-asa Jehoiaba mere onwe-ya ka ọ di ike, o we chita ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise, bú Azaraia nwa Jehoram, na Ishmael nwa Jehohanan, na Azaraia nwa Obed, na Maaseia nwa Adaia, na Elishafat nwa Zikri, me ka ya na ha b͕a ndu.

2. Ha we nāga buruburu nime Juda, chikọputa ndi Livai n'obodo nile nke Juda, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke Israel, ha we biarue Jerusalem.

3. Nkpọkọta ahu nile na eze we b͕a ndu n'ulo Chineke. Ọ si ha, Le, nwa eze gābu eze, dika Jehova kwuworo bayere umu Devid.

4. Nka bu ihe unu gēme: otù uzọ n'uzọ atọ nime unu, bú ndi nābà nime n'ubọchi-izu-ike, bú nke ndi-nchu-àjà na nke ndi Livai, gābu ndi-ọnu-uzọ-ama nke nbata-uzọ nile;

5. otù uzọ n'uzọ atọ gānọ kwa n'ulo eze, otù uzọ n'uzọ atọ kwa n'ọnu-uzọ-ama nke ntọ-ala: ndi Juda nile gānọ kwa n'ogige ulo Jehova nile.

6. Ma ka onye ọ bula ghara ibà n'ulo Jehova, ọ bu nání ndi-nchu-àjà, na ndi n'etiti ndi Livai ndi nēje ozi; ndi ahu gābà, n'ihi na ndi nsọ ka ha bu: ma ndi Juda nile gēdebe ihe-ndebe ulo Jehova.

7. Ndi Livai gānọ kwa eze buruburu, nwoke ọ bula na ihe-agha-ya n'aka-ya; ma onye nābata n'ulo, ka eme ka ọ nwua: unu nọye-kwa-ra eze mb͕e ọ nābà nime, na mb͕e ọ nāpu n'èzí.

8. Ndi Livai na Juda nile we me dika ihe nile si di nke Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, nyere n'iwu: ha we chiri, nwoke ọ bula ndikom-ya, bú ndi nābà nime n'ubọchi-izu-ike, ha na ndi nāpu apu n'ubọchi-izu-ike; n'ihi na Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, emeghi ka òkè di iche iche pua n'ije-ozi-ha.

9. Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, we nye ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise ube, na ọta, na ọta ntà, nke eze, bú Devid, nwereri, nke di n'ulo Chineke.

10. O guzo ndi Juda nile, nwoke ọ bula na ihe-agha-ya n'aka-ya, site n'akuku aka-nri ulo ahu rue akuku aka-ekpe ulo ahu, n'akuku ebe-ichu-àjà na n'akuku ulo, n'akuku eze buruburu.

11. Ha we me ka nwa eze puta, ha we kpube ya okpu-eze, nye ya ihe-àmà, me ya eze: Jehoiada na umu-ya ndikom we te ya manu; ha we si, Ka eze di ndu.

12. Atalaia we nu olu ndi Juda ka ha nāb͕a ọsọ nēto kwa eze, o we biakute ndi ahu n'ulo Jehova:

13. ọ hu, ma, le, eze nēguzo n'akuku ogidi-ya na nbata, ndi-isi na opì-ha di kwa n'akuku eze; ndi nile nke ala ahu ṅuri-kwa-ra ọṅu, fùa opì; ndi-ọbù-abù ji kwa ihe abù kpọ, ndi nēme ka amara ito otuto nọ kwa. Atalaia we dọwa uwe-ya nile, si, Nkekọta imegide eze, nkekọta imegide eze.

14. Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, we me ka ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise puta, bú ndi-nlekọta usu-ndi-agha, si ha, Menu ka ọ pua ba n'etiti ariri; ma onye nābiaso ya n'azu, ka ewere mma-agha me ka ọ nwua:n'ihi na onye-nchu-àjà siri, Unu emela ka ọ nwua n'ulo Jehova.

15. Ha we doro ya onwe-ha n'akuku abua; o we ba na nbata nke ọnu-uzọ-ama inyinya n'ulo eze: ha we me ka ọ nwua n'ebe ahu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ihe Emere 23