Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 22:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Ndi bi na Jerusalem we me Ehazaia nwa-ya nke-ntà eze n'ọnọdu ya: n'ihi na usu ndi nāpunara madu ihe, bú ndi soro ndi Arebia ba n'ọmuma-ulo-ikwū, b͕uru ndi nile bu ya okenye. Ehazaia nwa Jehoram, bú eze Juda, we buru eze.

2. Ọgu arọ abua na abua ka Ehazaia b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze otù arọ na Jerusalem: ma aha nne-ya bu Atalaia nwa Ọmri.

3. Ya onwe-ya je-kwa-ra ije n'uzọ nile nke ulo Ehab: n'ihi na nne-ya bu onye nādu ya ọdu imebi iwu.

4. O we me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, dika ulo Ehab mere: n'ihi na ndi ahu buru ya ndi nādu ọdu mb͕e ọnwu nna-ya gasiri, iwetara ya nbibi.

5. O jeghari-kwa-ra n'idu-ọdu-ha, we soro Jehoram nwa Ehab, bú eze Israel, ibuso Hazael, bú eze Siria, agha na Remot-gilead: ndi Siria we tib͕ue Joram.

6. O we lata ka agwọ ya nime Jezreel n'ihi ntib͕u nke ha tib͕uru ya na Rema, mb͕e o nēbuso Hazael, bú eze Siria, agha. Azaraia nwa Jehoram, bú eze Juda, we rida ihu Jehoram nwa Ehab nime Jezreel, n'ihi na ọ nāria ọria.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ihe Emere 22