O we me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, dika ulo Ehab mere: n'ihi na ndi ahu buru ya ndi nādu ọdu mb͕e ọnwu nna-ya gasiri, iwetara ya nbibi.