Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 20:27-37 Bible Nso (IGBOB)

27. Ha we lata, nwoke ọ bula nke Juda na Jerusalem, Jehoshafat nāga kwa n'iru ha, iwere ọṅù lata na Jerusalem; n'ihi na Jehova mere ka ha ṅuria ọṅu n'iru ndi-iro-ha.

28. Ha we chiri une, na ubọ-akwara, na opì, biarue Jerusalem rue ulo Jehova.

29. Oké egwu Chineke we dikwasi ala-eze nile nke ala nile ọzọ, mb͕e ha nuru na Jehova busoro ndi-iro Israel agha.

30. Ala-eze Jehoshafat we di jū: n'ihi na Chineke-ya mere ka o zuru ike buruburu.

31. Jehoshafat we buru eze Juda: ọ b͕ara orú arọ na iri na ise mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze orú arọ na ise nime Jerusalem: aha nne-ya bu Azuba nwa-nwayi Shilhi.

32. O jere ije n'uzọ Esa nna-ya, o sighi kwa nime ya wezuga onwe-ya, nēme ihe ziri ezi n'anya Jehova.

33. Nání na ewezugaghi ebe di elu; ma rue ub͕u a ndi Juda edozighi obi-ha nye Chineke nke ndi bu nna-ha.

34. Ma ihe nile Jehoshafat mere nke fọduru, nke-mbu na nke-ikpe-azu, le, edewo ha n'akwukwọ ihe emere nke Jihu nwa Hanani, onye etiyere aha-ya n'akwukwọ ndi-eze Israel.

35. Ma mb͕e ihe ndia gasiri, Jehoshafat, bú eze Juda, jikọrọ onwe-ya na Ehazaia, bú eze Israel; onye ahu nēmebi iwu n'omume-ya:

36. o we jikọ onwe-ya na ya ime ub͕ọ ijeru Tashish: ha we me ub͕ọ ahu n'Ezion-geba.

37. Elieza nwa Dodavahu nke Marisha we bu amuma megide Jehoshafat, si, N'ihi na i jikọrọ onwe-gi na Ehazaia, Jehova etipúwo ihe i mere. Ewe tiwa ub͕ọ ahu nile, ha enweghi kwa ike ijeru Tashish.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ihe Emere 20