Elieza nwa Dodavahu nke Marisha we bu amuma megide Jehoshafat, si, N'ihi na i jikọrọ onwe-gi na Ehazaia, Jehova etipúwo ihe i mere. Ewe tiwa ub͕ọ ahu nile, ha enweghi kwa ike ijeru Tashish.