Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 20:22-37 Bible Nso (IGBOB)

22. Ma na mb͕e ha malitere iti nkpu na ito otuto, Jehova tiyere ndi nēru nbì imegide umu Amon na Moab na ugwu Sia, bu ndi nābakuru Juda; ewe tib͕ue ha.

23. Umu Amon na Moab we guzo imegide ndi bi n'ugwu Sia, iwezuga ha ka ebibie ha na ikpochapu ha: mb͕e ha mere ka ndi bi na Sia gwusia, ha we yere onwe-ha aka, nwoke na ibe-ya, ibibi onwe-ha.

24. Juda we biarue ulo-nche, rue ọzara, ha we le ìgwè madu ahu anya; ma, le, ha bu ozu ozu daworo n'ala, ọ dighi kwa onye b͕apuru ab͕apu.

25. Jehoshafat na ndi-ya we bia iluta ihe-nkwata-ha n'agha, ha we hu n'etiti ha ma àkù ma ozu ma ihe di oké ọnu-ahia n'uba, ha we napusia onwe-ha ihe, kari nke ha nwere ike ibū: ha we nọ ubọchi atọ nāluta ihe-nkwata n'agha, n'ihi na ihe bara uba ka ọ bu.

26. Ma n'ubọchi nke-anọ ha kpọkọtara onwe-ha na ndagwurugwu Beraka; n'ihi na n'ebe ahu ka ha gọziri Jehova: n'ihi nka ka ha kpọrọ aha ebe ahu, Ndagwurugwu Bekara, rue ta.

27. Ha we lata, nwoke ọ bula nke Juda na Jerusalem, Jehoshafat nāga kwa n'iru ha, iwere ọṅù lata na Jerusalem; n'ihi na Jehova mere ka ha ṅuria ọṅu n'iru ndi-iro-ha.

28. Ha we chiri une, na ubọ-akwara, na opì, biarue Jerusalem rue ulo Jehova.

29. Oké egwu Chineke we dikwasi ala-eze nile nke ala nile ọzọ, mb͕e ha nuru na Jehova busoro ndi-iro Israel agha.

30. Ala-eze Jehoshafat we di jū: n'ihi na Chineke-ya mere ka o zuru ike buruburu.

31. Jehoshafat we buru eze Juda: ọ b͕ara orú arọ na iri na ise mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze orú arọ na ise nime Jerusalem: aha nne-ya bu Azuba nwa-nwayi Shilhi.

32. O jere ije n'uzọ Esa nna-ya, o sighi kwa nime ya wezuga onwe-ya, nēme ihe ziri ezi n'anya Jehova.

33. Nání na ewezugaghi ebe di elu; ma rue ub͕u a ndi Juda edozighi obi-ha nye Chineke nke ndi bu nna-ha.

34. Ma ihe nile Jehoshafat mere nke fọduru, nke-mbu na nke-ikpe-azu, le, edewo ha n'akwukwọ ihe emere nke Jihu nwa Hanani, onye etiyere aha-ya n'akwukwọ ndi-eze Israel.

35. Ma mb͕e ihe ndia gasiri, Jehoshafat, bú eze Juda, jikọrọ onwe-ya na Ehazaia, bú eze Israel; onye ahu nēmebi iwu n'omume-ya:

36. o we jikọ onwe-ya na ya ime ub͕ọ ijeru Tashish: ha we me ub͕ọ ahu n'Ezion-geba.

37. Elieza nwa Dodavahu nke Marisha we bu amuma megide Jehoshafat, si, N'ihi na i jikọrọ onwe-gi na Ehazaia, Jehova etipúwo ihe i mere. Ewe tiwa ub͕ọ ahu nile, ha enweghi kwa ike ijeru Tashish.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ihe Emere 20