Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 2:9-18 Bible Nso (IGBOB)

9. ọbuná idozirim osisi n'uba: n'ihi na ulo ahu nke mu onwem nēwu gādi uku di kwa ebube.

10. Ma, le, m'gēnye ndi-orù-gi, bú ndi nāwa ihe-ọwuwa ndi nēb͕utu osisi, orú nnù ọtùtù cor uzọ abua na nnù iri nke ọka wheat asuru asu, na orú nnù ọtùtù cor uzọ abua na nnù iri nke ọka barley, na orú nnù ọtùtù bath uzọ abua na nnù iri nke manya-vine, na orú nnù ọtùtù bath uzọ abua na nnù iri nke manu.

11. Huram, bú eze Taia, we were odide-akwukwọ, nke o zitere Solomon, si, N'ihi na Jehova huru ndi-Ya n'anya, n'ihi ya ka O mere gi eze-ha.

12. Huram we si, Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke Israel, bu, Onye mere elu-igwe na uwa, Onye nyeworo Devid, bú eze, nwa-nwoke nke mara ihe, onye mara ezi uche na nghọta, onye gēwuru Jehova ulo, wu-kwa-ra ala-eze-ya ulo.

13. Ma ub͕u a ezitewom otù nwoke nke mara ihe, onye mara nghọta, nke Huram, bú nnam,

14. bú nwa nke nwayi nke sitere n'umu-ndinyom Dan, ma nna-ya bu nwoke Taia, ọ bu onye mara ilu ọlu n'ọla-edo, na n'ọla-ọcha, na n'ọla, na n'ígwè, na nkume, na n'osisi, na n'ogho ododo, na n'ogho anunu, na n'ezi ákwà ọcha, na n'ogho uhie; na ib͕u eb͕ub͕u ọ bula, na ichèputa ihe-nchèputa ọ bula: ka ewe nye ya ọnọdu n'etiti ndi-gi mara ihe, na ndi mara ihe nke onye-nwem, bú Devid nna-gi.

15. Ma ub͕u a ọka wheat ahu na ọka barley ahu na manu ahu na manya-vine ahu, bú nke onye-nwem kwuru, ya zitere ndi-orù-ya:

16. Ayi onwe-ayi gēb͕utu kwa osisi site na Lebanon, dika nkpà-gi nile si di: ayi gāb͕a kwa ha me ka ha se n'elu oké osimiri rue gi aru, rue Jafo; gi onwe-gi gēbugota kwa ha na Jerusalem.

17. Solomon we gua ndikom nile, bú ndi-ọbìa, ndi nọ n'ala Israel, mb͕e ọgugu ahu gasiri, bú nke Devid nna-ya guru ha; ewe hu na ha di orú nnù ndikom uzọ iri-na-iteghete na nnù anọ.

18. O we me orú nnù uzọ asatọ na nnù iri-na-ise nime ha ka ha buru ndi-ibu, na orú nnù uzọ iri ka ha buru ndi nāwa ihe-ọwuwa n'ugwu, na nnù iteghete ka ha buru ndi edoro ndi-isi ime ka ndi ahu fè òfùfè.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ihe Emere 2