O we me orú nnù uzọ asatọ na nnù iri-na-ise nime ha ka ha buru ndi-ibu, na orú nnù uzọ iri ka ha buru ndi nāwa ihe-ọwuwa n'ugwu, na nnù iteghete ka ha buru ndi edoro ndi-isi ime ka ndi ahu fè òfùfè.