1. Jehoshafat, bú eze Juda, we laghachi n'ulo-ya n'udo, rue Jerusalem.
2. Jihu nwa Hanani, bú onye-ọhu-uzọ, we pua izute ya, ọ si eze, bú Jehoshafat, Ò kwesiri gi iyere onye nēmebi iwu aka? ọ̀ bu kwa ndi nākpọ Jehova asì ka i nāhu n'anya? ma n'ihi ihe a iwe dikwasi gi site n'iru Jehova.
3. Otú ọ di, achọtawo ezi ihe n'aka-gi, n'ihi na i mewo ka Asherot si n'ala nka gabiga, i we dozie obi-gi ichọ Chineke.
4. Jehoshafat we biri na Jerusalem: o we jeghachi pua jegharia n'etiti ndi-ya site na Bia-sheba rue ugwu Efraim, me ka ha laghachikute Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha.
5. O we guzo ndi-ikpe n'ala-ya n'obodo nile ewusiri ike nke Juda, n'obodo n'obodo,
6. ọ si ndi-ikpe, Lenu ihe unu onwe-unu nēme: n'ihi na ọ bughi madu ka unu nēkpere ikpe, kama ọ bu Jehova; Ọ nọye-kwa-ra unu n'okwu ikpe-unu.
7. Ma ub͕u a ka oké egwu Jehova dikwasi unu; lezienu anya, me ya: n'ihi na ọ dighi ajọ omume, ma-ọbu ihu-madu-iru-ọma, ma-ọbu inara-ihe-iri-ngo, di nime Jehova, bú Chineke-ayi.
8. Ọzọ kwa, nime Jerusalem ka Jehoshafat guzoro ufọdu nime ndi Livai na ndi-nchu-àjà, na ufọdu nime ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke Israel, ikpe ikpe Jehova, na idozi ise-okwu. Ha we laghachi na Jerusalem.
9. O nye ha iwu, si, Otú a ka unu gēme n'egwu Jehova, na n'ikwesi-ntukwasi-obi, na n'obi zuru okè.