Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 12:9-16 Bible Nso (IGBOB)

9. Shaishak, bú eze Ijipt, we rigota imegide Jerusalem, we wepu àkù nile nke ulo Jehova na àkù nile nke ulo eze; ha nile ka o wepuru: o wepu-kwa-ra ọta ọla-edo nile nke Solomon mere.

10. Eze, bú Rehoboam, we me ọta ọla n'ọnọdu ha, nye ha n'aka ndi-isi ndi-ọb͕a-ọsọ, bú ndi nēche ọnu-uzọ ulo eze, ka ha lekọta ha anya.

11. O rue, mb͕e ọ bula eze nābà n'ulo Jehova, na ndi-ọb͕a-ọsọ biara we būru ha, bughachi kwa ha n'ime-ulo ndi-ọb͕a-ọsọ.

12. Ma mb͕e o wedara onwe-ya n'ala, iwe Jehova siri n'aru ya chigharia, O we ghara ibibizu ya: ọzọ kwa, ezi ihe ufọdu di na Juda.

13. Eze, bú Rehoboam, we me onwe-ya ka ọ di ike na Jerusalem, o we buru eze: n'ihi na Rehoboam b͕ara ọgu arọ abua na otù mb͕e ọ malitere ibu eze, o we buru eze arọ iri-na-asa na Jerusalem, bú obodo ahu nke Jehova rọputara n'ebo nile nke Israel, ido aha-Ya n'ebe ahu: aha nne-ya bu Neama nwayi Amon.

14. O we me ihe ọjọ, n'ihi na o dozighi obi-ya ichọ Jehova.

15. Ma ihe nile Rehoboam mere, nke-mbu na nke-ikpe-azu, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere nke Shemaia, bú onye-amuma, na n'akwukwọ Ido, bú onye-ọhu-uzọ, bayere akwukwọ-osuso-ọmumu? Ma agha di n'etiti Rehoboam na Jeroboam ubọchi nile.

16. Rehoboam we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'obodo Devid: Abaija nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ihe Emere 12