Solomon we chikọta ub͕ọ-ala na ndi-inyinya: o we nwe nnù ub͕ọ-ala atọ na ọgu iri, na orú nnù ndi-inyinya na nnù iri, o we do ha n'obodo ub͕ọ-ala, na n'ebe eze nọ na Jerusalem.