isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 1 Bible Nso (IGBOB)

1. Solomon nwa Devid we me onwe-ya ka ọ di ike n'ala-eze ya, Jehova, bú Chineke-ya, we nọyere ya, me ka ọ di uku ri nne.

2. Solomon we gwa Israel nile okwu, bú ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri na nke usu nile nke ọgu ndikom ise, na ndi-ikpe, na onye-isi ọ bula nke Israel nile, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna.

3. Solomon, ya na nkpọkọta ahu nile, we jerue ebe di elu nke di na Gibeon; n'ihi na n'ebe ahu ka ulo-ikwū nzute nke Chineke di, bú nke Moses, bú orù Jehova, mere n'ọzara.

4. Ma Devid siri na Kiriat-jearim bugota ib͕e Chineke rue ọnọdu nke Devid doziri ya: n'ihi na ọ mara ulo-ikwū nye ya nime Jerusalem.

5. Ma ebe-ichu-àjà ọla ahu, nke Bezalel nwa Uri, nwa Hua, mere, di n'ebe ahu n'iru ebe-obibi Jehova: Solomon na nkpọkọta ahu we chọ ya.

6. Solomon we rigo n'ebe ahu rue ebe-ichu-àjà ọla n'iru Jehova, nke di n'ulo-ikwū nzute, o we sure nnù àjà-nsure-ọku abua na ọgu iri n'elu ya.

7. N'abali ahu ka Chineke mere ka Solomon hu ya anya, O we si ya, Riọ ihe M'gēnye gi.

8. Solomon we si Chineke, Gi onwe-gi emeworo Devid nnam ebere uku, I we mem eze n'ọnọdu ya.

9. Ub͕u a, Jehova, bú Chineke, ka okwu-Gi nke I gwara Devid nnam buru ihe kwesiri ntukwasi-obi: n'ihi na Gi onwe-gi emewom eze otù ndi nke bara uba dika ájá ala.

10. Ub͕u a nyem amam-ihe na ihe-ọmuma, ka m'we nāpu apu nābata kwa abata n'iru ndi nka: n'ihi na ònye gēkpe ndi-Gi nka di uku ikpe?

11. Chineke we si Solomon, N'ihi na nka di n'obi-gi, ma i riọghi àkù, ma-ọbu ihe-nkpakọta, ma-ọbu nsọpuru, ma-ọbu ndu ndi nākpọ gi asì, i riọghi kwa ọtutu ubọchi; kama i riọworo onwe-gi amam-ihe na ihe-ọmuma, ka i we kpe ndim ikpe, bú ndi M'meworo gi eze-ha:

12. enyewo gi amam-ihe na ihe-ọmuma; M'gēnye kwa gi àkù, na ihe-nkpakọta, na nsọpuru, nke ndi-eze ndi buru gi uzọ nēnweghi otú a, ọ dighi kwa onye nke gēso gi gēnwe otú a.

13. Solomon we si n'ije ọ jeruru ebe di elu nke di na Gibeon, si n'iru ulo-ikwū nzute, biarue Jerusalem; o we buru eze Israel.

14. Solomon we chikọta ub͕ọ-ala na ndi-inyinya: o we nwe nnù ub͕ọ-ala atọ na ọgu iri, na orú nnù ndi-inyinya na nnù iri, o we do ha n'obodo ub͕ọ-ala, na n'ebe eze nọ na Jerusalem.

15. Eze we me ọla-ọcha na ọla-edo ka ọ di ka nkume na Jerusalem, o me-kwa-ra osisi cedar ka ha di ka osisi sycomore nke di n'ebe di ala ala n'uba.

16. Anēme kwa ka inyinya Solomon nwere si n'Ijipt puta; n'usu ka ndi-ahia eze nānara ha, otù usu n'ọnu-ahia-ya.

17. Ha we me ka otù ub͕ọ-ala rigota si n'Ijipt puta na nnù shekel ọla-ọcha na ọgu iri, na otù inyinya n'ọgu shekel asa na iri: otú a ka ha nēweputara eze nile nke ndi Het, na ndi-eze Siria, site n'aka-ha.