Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 8:8-12 Bible Nso (IGBOB)

8. Dika omume nile si di nke ha meworo site n'ubọchi M'mere ka ha si n'Ijipt rigota we rue ta, ha we rapum, fè chi ọzọ òfùfè, otú a ka ha onwe-ha nēme kwa gi.

9. Ma ub͕u a ge nti olu-ha: nání na i gāb͕asiri ha àmà ike, gosi kwa ha ikpé eze ahu nke gābu eze-ha.

10. Samuel we gwa ndi Israel, ndi nāriọ eze n'aka-ya, okwu nile nke Jehova.

11. O we si, Nka gābu ikpé eze ahu nke gābu eze-unu: umu-unu ndikom ka ọ gāchiri, doro ha onwe-ya n'ub͕ọ-ala-ya na n'elu inyinya-ya; ha gānab͕a kwa ọsọ n'iru ub͕ọ-ala-ya:

12. o gēdo-kwa-ra ha onwe-ya ibu ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri, na ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom abua na iri; na ilu ọlu-ubi-ya, na iwe ihe-ubi-ya, na ikpu ihe-agha-ya nile, na ihe nile nke ub͕ọ-ala-ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Samuel 8