Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 6:1-10 Bible Nso (IGBOB)

1. Ib͕e Jehova we di n'ọhia ndi Filistia ọnwa asa.

2. Ndi Filistia we kpọ ndi-nchu-aja na ndi nāju ase, si, Gini ka ayi gēme ib͕e Jehova? me ka ayi mara ihe ayi gēji zilaga ya n'ebe-ya.

3. Ha we si, Ọ buru na unu ezilaga ib͕e Chineke Israel, ezilagala ya n'aka efu; kama unu aghaghi inyeghachi Ya àjà-ikpe-ọmuma: mb͕e ahu agēme ka aru-unu di ike, agēme kwa ka unu mara ihe mere anēwezugaghi aka-Ya n'aru unu.

4. Ha we si, Gini gābu àjà-ikpe-ọmuma ahu nke ayi gēnyeghachi Ya? Ha we si, Dika ọnu-ọgugu ndi-isi ndi Filistia si di, ọ bu emerod ọla-edo ise na òké ọla-edo ise ka unu gēnyeghachi: n'ihi na otù ihe-otiti diri ha nile, di-kwa-ra ndi-isi-unu.

5. Unu gēme kwa onyinyo emerod-unu, na onyinyo òké-unu nke nēbibi ala-unu; unu gēnye kwa Chineke Israel nsọpuru: eleghi anya Ọ gēme ka aka-Ya di nfé pua n'aru unu, na n'aru chi nile unu, na n'ala-unu.

6. N'ìhi gini kwa ka unu nēme ka obi-unu di arọ́, dika ndi Ijipt na Fero mere ka obi-ha di arọ́? mb͕e Ọ kwara ha emò, hà ezilagaghi ha, ha we la?

7. Ma ub͕u a, werenu ihe me otù ub͕ọ-ala ọhu, chiri kwa nne-ehi abua nke nēnye umu ara, nke ọ dighi mb͕e yoke rigokwasiri ha, kegide-kwa-nu ehi ahu n'ub͕ọ-ala, me ka umu-ha si n'iso ha n'azu lata n'ulo:

8. were-kwa-nu ib͕e Jehova tiyekwasi ya n'ub͕ọ-ala ahu; tiye ihe ọla-edo ahu, nke unu nēnyeghachi Ya ka ọ buru àjà-ikpe-ọmuma, n'ib͕e ntà n'akuku-ya; zilaga-kwa-nu ya, ka ọ we la.

9. Le-kwa-nu, ọ buru na ọ rigo n'uzọ ókè-ala-ya rue Bet-shemesh, Ya onwe-ya emewo ayi oké ihe ọjọ a: ma ọ buru na ọ rigoghi otú a, ayi gāma kwa na ọ bughi aka-Ya tib͕uru ayi; ihe-ndabà ka ihe ahu bu, nke dabara ayi.

10. Ndikom ahu we me otú a; ha chiri nne-ehi abua nke nēnye umu ara, kegide ha n'ub͕ọ-ala ahu, mechibido umu-ha uzọ n'ulo:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Samuel 6