Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 4:16-22 Bible Nso (IGBOB)

16. Nwoke ahu we si Ilai, Mu onwem bu onye si n'usoro agha bia, mu onwem si kwa n'usoro agha b͕alaga ta. O we si, Gini bu ihe emere, nwam?

17. Onye ahu nke nēzì ozi ahu we za, si, Israel ab͕alagawo n'iru ndi Filistia, ọzọ kwa, oké ntib͕u adiwo n'etiti ndi Israel, ọzọ kwa, umu-gi ndikom abua, bú Họfnai na Finehas, anwuwo, ewerewo kwa ib͕e Chineke.

18. O rue, mb͕e o hotara ib͕e Chineke, na o si n'oche-ya dala azu n'akuku ọnu-uzọ-ama, olu-ya we b͕ajie, o we nwua: n'ihi na nwoke ahu bu agadi, di kwa arọ́. Ya onwe-ya kpe-kwa-ra Israel ikpe ọgu arọ abua.

19. Nwunye nwa-ya, bú nwunye Finehas, di ime, ọ gaje imu nwa: o we nu akukọ ahu na ewerewo ib͕e Chineke, na nna di-ya na di-ya anwuwo, o we ruru ala mua nwa; n'ihi na ime mere ya na mberede.

20. Ma na mb͕e ọnwu-ya ndinyom ndi nēguzo n'akuku ya we kwue, si, Atula egwu; n'ihi na nwoke ka i muworo. Ma ọ zaghi, ọ tukwasighi kwa obi-ya na ya.

21. O we kpọ aha nwa ahu Ikabod, si, Nsọpuru esiwo n'Israel pua: n'ihi owuwe ewere ib͕e Chineke, na n'ihi nna di-ya na di-ya.

22. O we si, Nsọpuru esiwo n'Israel pua; n'ihi na ewerewo ib͕e Chineke.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Samuel 4