Nwunye nwa-ya, bú nwunye Finehas, di ime, ọ gaje imu nwa: o we nu akukọ ahu na ewerewo ib͕e Chineke, na nna di-ya na di-ya anwuwo, o we ruru ala mua nwa; n'ihi na ime mere ya na mberede.