Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 30:22-31 Bible Nso (IGBOB)

22. Ndikom ọjọ nile na ndi jọb͕uru onwe-ha, n'etiti ndi soro Devid je, we za, si, N'ihi na ha esoghi ayi je, ayi agaghi-enye kwa ha ihe ọ bula nime ihe-nkwata nke ayi naputara, ma-ọbughi inye nwoke ọ bula nwunye-ya na umu-ya, ka ha we duru ha, la.

23. Devid we si, Umu-nnem, ihe Jehova nyere ayi, bú Onye debere ayi, nye kwa n'aka-ayi usu ahu ndi nāpunara madu ihe, ndi biara imegide ayi, unu agaghi-ewere ihe ahu me otú a.

24. Ònye gēge kwa unu nti n'okwu a? n'ihi na dika òkè nke onye nārida n'agha si di, otú a ka òkè nke onye nānọdu n'akuku ihe-ayi di: ha gēkekọ n'otù.

25. O rue, site n'ubọchi ahu we ga n'iru, na o doro ya ibu ukpuru na ibu ikpé nye Israel, rue ta.

26. Devid we biarue Ziklag, zigara ndi-okenye Juda, bú ndi-eyì-ya, ufọdu nime ihe-nkwata, si, Le, ihe-ngọzi unu gēnwe sitere n'ihe-nkwata nke ndi-iro Jehova;

27. o zigara ndi nọ na Bet-el, ziga-kwa-ra ndi nọ na Remot nke Negeb, ziga-kwa-ra ndi nọ na Jatia;

28. ziga-kwa-ra ndi nọ n'Aroea, ziga-kwa-ra ndi nọ na Sifmot, ziga-kwa-ra ndi nọ n'Eshtemoa;

29. ziga-kwa-ra ndi nọ na Rakal, ziga-kwa-ra ndi nọ n'obodo nile nke ndi Jerahmeel, ziga-kwa-ra ndi nọ n'obodo nile nke ndi-Kinait;

30. ziga-kwa-ra ndi nọ na Họma, ziga-kwa-ra ndi nọ na Koa-ashan, ziga-kwa-ra ndi nọ n'Atak;

31. ziga-kwa-ra ndi nọ na Hebron, ziga kwa n'ebe nile ebe Devid onwe-ya na ndikom-ya nējeghari.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Samuel 30