Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 30:1-9 Bible Nso (IGBOB)

1. O rue, mb͕e Devid na ndikom-ya biaruru Ziklag n'ubọchi nke-atọ, na ndi Amalek amadewo na Negeb, made kwa na Ziklag, ha etib͕uwo kwa Ziklag, sure ya n'ọku,

2. dọta kwa ndinyom na ndi nile nọ na ya n'agha, site n'onye ntà we rue onye uku: ha emeghi ka onye ọ bula nwua, kama ha dupuru ha, je ije-ha.

3. Devid na ndikom-ya we ba n'obodo, ma, le, esurewo ya n'ọku; adọtawo kwa ndinyom-ha na umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom n'agha.

4. Devid na ndi ya na ha nọ we welie olu-ha kwa ákwá, rue mb͕e ike nādighi ha n'aru ọzọ ikwa ákwá.

5. Adọta-kwa-ra ndinyom abua nke Devid n'agha, bú Ahinoam nwayi Jezreel, na Abigail nwunye Nebal onye Kamel.

6. Devid we nọ na nkpà nke-uku; n'ihi na ndi-ya siri ka ha were nkume tub͕ue ya, n'ihi na nkpuru-obi ndi-ya nile di ilu, nwoke ọ bula n'ihi umu-ya ndikom na n'ihi umu-ya ndinyom: ma Devid mere onwe-ya ka ọ di ike nime Jehova, bú Chineke-ya.

7. Devid we si Abaiata, bú onye-nchu-àjà, bú nwa Ahimelek, Biko, chitaram ephod nso. Abaiata we chita ephod ahu nso n'ebe Devid nọ.

8. Devid we jua Jehova ase, si, Ọ buru na achuam usu a ndi nāpunara madu ihe n'azu, #m'gēru ha aru? Ọ si ya, Chua: n'ihi na i ghaghi iru ha aru, i ghaghi kwa inaputa ha ihe nile.

9. Devid we je, ya onwe-ya na nnù ndikom na ọgu iri ndi soro ya, ọ biarue miri-iyi Besoa, ma ndi anārapu n'azu guzoro n'ebe ahu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Samuel 30