Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 28:6-15 Bible Nso (IGBOB)

6. Sọl we jua Jehova ase, ma Jehova azaghi ya, Ọ zaghi na nrọ, ma-ọbu n'Ìhè, ma-ọbu n'ọnu ndi-amuma.

7. Sọl we si ndi-orù-ya, Chọrọnum nwayi nwere mọ ọ nāju ihe, ka m'we jekuru ya, jua ya ase. Ndi-orù-ya we si ya, Le, otù nwayi di n'En-doa nke nwere mọ ọ nāju ihe.

8. Sọl we nwogharia onwe-ya, yiri uwe ọzọ, je, ya onwe-ya na ndikom abua tiyere ya, ha we biakute nwayi ahu n'abali: ọ si, Biko, were mọ i nāju ihe juaram ase, me ka ọ rigokutem, bú onye ọ bula m'gāsi gi.

9. Nwayi ahu we si ya, Le, gi onwe-gi amawo ihe Sọl mere, na o bipuwo n'ala ndi nāju mọ ihe na ndi-dibia-afa: n'ìhi gini kwa ka gi onwe-gi nāb͕ara ndum ọnyà ime ka m'nwua?

10. Sọl we were Jehova ṅuara ya iyi, si, Jehova nādi ndu, Ahuhu ajọ omume agaghi-ezute gi ma-ọli n'ihe a.

11. Nwayi ahu we si, Ònye ka m'gēme ka ọ rigokute gi? Ọ si, Me ka Samuel rigokutem.

12. Nwayi ahu we hu Samuel, tie nkpu n'oké olu: nwayi ahu we gwa Sọl okwu, si, N'ìhi gini ka i ghọb͕uworom? n'ihi na gi onwe-gi bu Sọl.

13. Eze we si ya, Atula egwu: n'ihi na ọ̀ bu gini ka i huworo? Nwayi ahu we si Sọl, Ahuwom chi ka ha nēsi n'ala rigota.

14. Ọ si ya, Gini bu udi-aru-ya? Nwayi ahu we si, Agadi nwoke nārigota; eji kwa uwe-nwuda kpuchi nwoke ahu. Sọl we mata na Samuel ka ọ bu, ọ we rube isi-ya, da kpue iru-ya n'ala, kpọ isi ala.

15. Samuel we si Sọl, N'ìhi gini ka i nēkweghi ka m'nọdu ndu, ime ka m'rigota? Sọl we si, Anọm na nkpà nke-uku; ndi Filistia nēbusokwam agha, ma Chineke ewezugawo Onwe-ya n'arum, Ọ dighi-azakwam ọzọ, ma ọ bu n'aka ndi-amuma ma-ọbu na nrọ: m'we kpọ gi, ka i we me ka m'mara ihe m'gēme.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Samuel 28