Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 25:6-9 Bible Nso (IGBOB)

6. si kwa ya otú a, Ndu-gi! gi onwe-gi, udo; ulo-gi, udo kwa; ihe nile i nwere, udo kwa.

7. Ma ub͕u a anuwom na i nwere ndi nākpacha aji anu: ub͕u a ayi na ndi-ọzùzù-aturu i nwere anọwo, ayi emeghi ka ihere me ha, ọ dighi kwa ihe ọ bula ha lere anya ya na o furu efu, ubọchi nile ha nọ na Kamel.

8. Jua umu-okorọbia-gi, ha gēgosi kwa gi: ka umu-okorọbia huta kwa amara n'iru gi; n'ihi na ọ bu n'ezi ubọchi ka ayi biaworo: biko, nye ndi-orù-gi, nye kwa nwa-gi Devid, ihe aka-gi gāchọta.

9. Umu-okorọbia Devid we bata, gwa Nebal okwu n'aha Devid dika okwu ndia nile si di, we nọdu du.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Samuel 25