na nka agaghi-aburu gi ihe-nṅaghari, ọ gaghi-aburu kwa onye-nwem ihe-isu-ngọngọ obi, na i wusiwo ọbara n'efu, ma-ọbu na onye-nwem azọputawo onwe-ya: ma mb͕e Jehova gēmewori onye-nwem nma, i gēcheta kwa orù-gi nwayi.