Biko, b͕aghara njehie orù-gi nwayi: n'ihi na Jehova aghaghi imere onye-nwem ulo kwesiri ntukwasi-obi, n'ihi na ọ bu agha nile nke Jehova ka onye-nwem nēbu; agaghi-ahuta kwa ihe ọjọ n'aru gi ubọchi-gi nile.