Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 20:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Devid we si na Naiot nime Rema b͕alaga, ọ bia kwue n'iru Jonatan, si, Gini ka m'meworo? gini bu ajọ omumem? gini bu kwa nmehiem n'iru nna-gi, na ọ nāchọ ndum?

2. Ọ si ya, Ya buru ihe-árú; i gaghi-anwu: le, nnam adighi-eme ihe uku ma-ọbu ihe ntà, ma ọ buru na o kpughepughi ntim ka m'nu ya: gini me-kwa-ra nnam ji zonarim ihe a? ọ bughi otú a.

3. Devid we ṅua iyi ọzọ, si, Nna-gi amawo nke-ọma na ahutawom amara n'iru gi; o we si, Ka Jonatan ghara ima nka, ka o we ghara iwuta ya: ma otú ọ di, Jehova nādi ndu, nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, nání ihe ra ka otù nzọ-ukwu di n'ab͕ata mu na ọnwu.

4. Jonatan we si Devid, Gini ka nkpuru-obi-gi nāsi? m'gēme-kwa-ra gi ya.

5. Devid we si Jonatan, Le, ọnwa ọhu gāpu echi, mu onwem aghaghi kwa iso eze nọdu n'iri ihe: ma zilagam, ka m'we zo onwem n'ọhia rue anyasi nwa-nne-echi.

6. Ọ buru na nna-gi ele anyam ma-ọli, i gāsi kwa, Devid riọsirim ike ka m'rapu ya ka ọ b͕a ọsọ je Bet-lehem, bú obodo-ya: n'ihi na àjà arọ diri ab͕uru-ya nile n'ebe ahu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Samuel 20