Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 19:9-19 Bible Nso (IGBOB)

9. Mọ ọjọ nke Jehova we di n'aru Sọl, ma ya onwe-ya nānọdu n'ulo-ya, ube-ya di kwa n'aka-ya; Devid we were aka-ya nākpọ ubọ.

10. Sọl we chọ iwere ube ahu tugide Devid ọbuná na mb͕idi; ma o repuru n'iru Sọl, ọ we tugide ube ahu na mb͕idi: Devid we b͕alaga, wepuga onwe-ya n'abali ahu.

11. Sọl we ziga ndi-ozi n'ulo Devid, iche ya nche, na ime ka ọ nwua n'ututu: Maikal, bú nwunye-ya, we gosi Devid, si, Ọ buru na i zọputaghi ndu-gi abali a, agēme ka gi onwe-gi nwua echi.

12. Maikal we weda Devid site na window: o we je, b͕alaga, wepuga onwe-ya.

13. Maikal we were terafim-ya, tọb͕ọ ya n'ihe-ndina-ya, tiye ákwà-ob͕ub͕o eji aji ewu me n'okpuru isi-ya, were ákwà-nb͕okwasi kpuchie ya.

14. Sọl we ziga ndi-ozi iwere Devid, ma Maikal siri, Aru adighi ya ike.

15. Sọl we ziga ndi-ozi ahu ihu Devid, si, Bugotaram ya n'ihe-ndina-ya, ka m'we me ka ọ nwua.

16. Ndi-ozi ahu we bata, ma, le, terafim ahu di n'ihe-ndina, ákwà-ob͕ub͕o nke eji aji ewu me di kwa n'okpuru isi-ya.

17. Sọl we si Maikal, N'ìhi gini ka i ghọb͕uworom otú a, we zilaga onye-irom, o we wepuga onwe-ya? Maikal we si Sọl, Ya onwe-ya sirim, Zilagam: n'ìhi gini ka m'gēme ka i nwua?

18. Ma Devid b͕alagara, wepuga onwe-ya, biakute Samuel rue Rema, gosi ya ihe nile Sọl mere ya. Ọ we je, ya onwe-ya na Samuel, ha we biri na Naiot.

19. Ewe gosi Sọl, si, Le, Devid nọ na Naiot nime Rema.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Samuel 19