Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 17:7-20 Bible Nso (IGBOB)

7. Osisi ube-ya di kwa ka oké ókpòrò di arọ́ nke ọkpa-ákwà ji akpa ákwà; isi ube-ya di nnù shekel ígwè na ọgu iri: onye nēbu ọta-ya nēje n'iru ya.

8. O we guzo kpọ usoro-agha nile nke Israel òkù, si ha, N'ìhi gini ka unu putaworo ido agha-unu n'usoro? mu onwem, àbughm onye Filistia? ma unu onwe-unu, ùnu abughi ndi-orù Sọl nwe? rọputaranu onwe-unu otù nwoke, ka ọ ridakutekwam.

9. Ọ buru na ọ puru ilusom ọ̀gù, we tib͕uem, ayi gābu-kwa-ra unu ndi-orù: ma ọ buru na mu onwem puru ilub͕u ya, we tib͕ue ya, unu gābu-kwa-ra ayi ndi-orù, we fè ayi òfùfè.

10. Onye Filistia ahu we si, Mu onwem atawo usoro-agha nile nke Israel uta ta; nyenum otù nwoke, ka ayi we lurita ọ̀gù.

11. Sọl na Israel nile we nu okwu nile ndia nke onye Filistia, ha we tua ujọ, tua egwu nke-uku.

12. Ma Devid bu nwa onye Efrat ahu nke Bet-lehem-juda, nke aha-ya bu Jesi; o nwe-kwa-ra umu-ndikom asatọ: nwoke ahu aghọwo kwa agadi n'etiti ndikom n'ubọchi Sọl.

13. Umu-ndikom atọ nke Jesi ndi bu okenye we je soro Sọl ibu agha: aha umu-ya ndikom atọ ndi jere agha bu Elaiab ọkpara-ya, na Abinadab nke so ya, na Shama, bú nke-atọ.

14. Ma Devid, ya onwe-ya bu ọdudù-nwa: atọ ahu, bú okenye, we jeso Sọl n'azu.

15. Ma Devid nējekuru Sọl, nēsi kwa n'ebe Sọl nọ laghachi, izù ìgwè ewu na aturu nna-ya na Bet-lehem.

16. Onye Filistia ahu nābiaru kwa nso n'isi-ututu na n'anyasi, we guzo onwe-ya ọgu abali abua.

17. Jesi we si Devid nwa-ya, Biko, wegara umu-nne-gi otù ephah nke ọka nka aṅara n'ọku, na ob͕e achicha iri ndia, būru ha b͕a ọsọ je n'ọmuma-ulo-ikwū jekuru umu-nne-gi;

18. buga-kwa-ra onye-isi usu nnù ndikom na ọgu ise nke ha cheese iri ndia, lekọta kwa umu-nne-gi ma ha nọ n'udo, nara kwa ihe-mbe-ha.

19. Ma Sọl, na ndi ahu, na ndikom nile nke Israel, nọ na ndagwurugwu Ila, nēbuso ndi Filistia agha.

20. Devid we bilie n'isi-ututu, rapu ìgwè ewu na aturu ahu n'aka onye nēdebe aturu, o we būru, je, dika Jesi nyere ya iwu: o we biarue ebe anēdebe ub͕ọ-ala, mb͕e usu-ndi-agha ndi nāpukuru usoro-agha nēti nkpu n'agha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Samuel 17