Umu-ndikom atọ nke Jesi ndi bu okenye we je soro Sọl ibu agha: aha umu-ya ndikom atọ ndi jere agha bu Elaiab ọkpara-ya, na Abinadab nke so ya, na Shama, bú nke-atọ.