Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 17:2-12 Bible Nso (IGBOB)

2. Sọl na ndikom Israel we chikọta onwe-ha, ma ulo-ikwū-ha na ndagwurugwu Ila, we do agha n'usoro izute ndi Filistia.

3. Ndi Filistia we nēguzo n'ugwu n'otù akuku, Israel nēguzo kwa n'ugwu n'akuku nke-ọzọ: ndagwurugwu we di n'etiti ha.

4. Onye-nputa-ọb͕ọ-agha we si n'ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia puta, aha-ya bu Gọlaiat, sitere na Gat, ogologo-ya di cubit isi na otù ntù-aka.

5. Okpu-agha ọla di kwa n'isi-ya, ọ bu kwa uwe-agha emere dika akpirikpa-azù ka eyikwasiri ya; ọtùtù uwe-agha ahu di nnù shekel ọla iri-na-abua na ọgu iri.

6. Ihe-ọla eji kpuchi ukwu di kwa n'ukwu-ya abua, nkpunkpu ube ọla di kwa n'etiti ubu-ya abua.

7. Osisi ube-ya di kwa ka oké ókpòrò di arọ́ nke ọkpa-ákwà ji akpa ákwà; isi ube-ya di nnù shekel ígwè na ọgu iri: onye nēbu ọta-ya nēje n'iru ya.

8. O we guzo kpọ usoro-agha nile nke Israel òkù, si ha, N'ìhi gini ka unu putaworo ido agha-unu n'usoro? mu onwem, àbughm onye Filistia? ma unu onwe-unu, ùnu abughi ndi-orù Sọl nwe? rọputaranu onwe-unu otù nwoke, ka ọ ridakutekwam.

9. Ọ buru na ọ puru ilusom ọ̀gù, we tib͕uem, ayi gābu-kwa-ra unu ndi-orù: ma ọ buru na mu onwem puru ilub͕u ya, we tib͕ue ya, unu gābu-kwa-ra ayi ndi-orù, we fè ayi òfùfè.

10. Onye Filistia ahu we si, Mu onwem atawo usoro-agha nile nke Israel uta ta; nyenum otù nwoke, ka ayi we lurita ọ̀gù.

11. Sọl na Israel nile we nu okwu nile ndia nke onye Filistia, ha we tua ujọ, tua egwu nke-uku.

12. Ma Devid bu nwa onye Efrat ahu nke Bet-lehem-juda, nke aha-ya bu Jesi; o nwe-kwa-ra umu-ndikom asatọ: nwoke ahu aghọwo kwa agadi n'etiti ndikom n'ubọchi Sọl.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Samuel 17