Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 14:6-22 Bible Nso (IGBOB)

6. Jonatan we si nwa-okorọbia nēbu ihe-agha-ya, Bia, ka ayi gabiga rue ebe-nguzo-ndi-agha nke ndia anēbìghi úgwù: eleghi anya Jehova gāluru ayi ọlu: n'ihi na ihe-nb͕ochi adighi n'ebe Jehova nọ izọputa site n'iwere ọtutu madu ma-ọbu site n'iwere madu ole-na-ole.

7. Onye nēbu ihe-agha-ya we si ya, Me ihe nile nke di n'obi-gi: chigharia onwe-gi, le, mu onwem nēso gi dika obi-gi si chọ.

8. Jonatan we si, Le, ayi onwe-ayi nāgabiga rue ndikom ahu, ayi gēkpughe-kwa-ra ha onwe-ayi.

9. Ọ buru na ha asi ayi otú a, Guzonu du rue mb͕e ayi ruru unu aru; ayi gēguzo kwa n'ọnọdu-ayi, ayi agaghi-arigokuru kwa ha.

10. Ma ọ buru na ha asi otú a, Rigokutenu ayi; ayi gārigo kwa: n'ihi na Jehova enyewo ha n'aka-ayi: nka gābu-kwa-ra ayi ihe-iriba-ama.

11. Ha abua we kpughere ndi ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia onwe-ha: ndi Filistia we si, Le, ndi-Hibru nēsi n'ọnu di iche iche ebe ha zoro onwe-ha puta.

12. Ndikom ebe-nguzo-ndi-agha ahu we za Jonatan na onye nēbu ihe-agha-ya, si, Rigokutenu ayi, ayi gēme kwa ka unu mara ihe. Jonatan we si onye nēbu ihe-agha-ya, Sorom n'azu rigo: n'ihi na Jehova enyewo ha n'aka Israel.

13. Jonatan we bikwasi aka-ya na ukwu-ya rigo, onye nēbu ihe-agha-ya nēso kwa ya n'azu: ha we da n'iru Jonatan; onye nēbu ihe-agha-ya nēme kwa ka ha nwua n'azu ya.

14. Ntib͕u mbu ahu, nke Jonatan na onye nēbu ihe-agha-ya tib͕uru, we ra ka orú ndikom, n'ihe ra ka nkera furrow nke otù acre ala-ubi n'ọtùtù.

15. Ọma-jijiji we di n'ọmuma-ulo-ikwū, na n'ọhia, na n'etiti ndi ahu nile; ndi ebe-nguzo-ndi-agha na ndi-nbibi, ha onwe-ha ma-kwa-ra jijiji: ala de-kwa-ra ùdé; o we ghọ ọma-jijiji nke Chineke.

16. Ndi-nche Sọl nwere na Gibea Benjamin we hu; ma, le, ìgwè madu ahu b͕azere, we nēje iru na azu.

17. Sọl we si ndi ya na ha nọ, Biko, gukọtanu, hu onye siworo n'etiti ayi pua. Ha we gukọta, ma, le, Jonatan na onye nēbu ihe-agha-ya anọghi ya.

18. Sọl we si Ahaija, Bute ib͕e Chineke nso. N'ihi na ib͕e Chineke di n'etiti umu Israel n'ubọchi ahu.

19. O rue, mb͕e Sọl nāgwa onye-nchu-àjà ahu okwu, na ùzù nke di n'ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia we nāda kari, nāga n'iru nāba kwa uba: Sọl we si onye-nchu-àjà, Sepu aka-gi.

20. Sọl na ndi nile ya na ha nọ we kpọkọta onwe-ha, ba n'agha ahu: ma, le, mma-agha nwoke ọ bula digidere ibe-ya, oké ọb͕ub͕a-aghara uku we di.

21. Ma ndi-Hibru ndi diri ndi Filistia na mb͕e gara aga, ndi soro ha rigo n'ọmuma-ulo-ikwū buruburu, ndi ahu we chighari kwa idi n'akuku Israel ndi nọ n'aka Sọl na Jonatan.

22. Ndikom nile nke Israel ndi zoro onwe-ha n'ugwu Efraim we nu na ndi Filistia ab͕alagawo, ha onwe-ha we sogidesi kwa ha ike n'agha ahu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Samuel 14