O rue, mb͕e Sọl nāgwa onye-nchu-àjà ahu okwu, na ùzù nke di n'ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia we nāda kari, nāga n'iru nāba kwa uba: Sọl we si onye-nchu-àjà, Sepu aka-gi.