Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 12:8-16 Bible Nso (IGBOB)

8. Mb͕e Jekob batara n'Ijipt, mb͕e nna-unu-hà tikuru Jehova nkpu, Jehova we zite Moses na Eron, ndi mere ka nna-unu-hà si n'Ijipt puta, me kwa ka ha biri n'ebe a.

9. Ha we chezọ Jehova, bú Chineke-ha, O we renye ha n'aka Sisera, bú onye-isi usu-ndi-agha Hezoa, na n'aka ndi Filistia, na n'aka eze Moab, ha we buso ha agha.

10. Ha we tikue Jehova nkpu, si, Ayi emehiewo, n'ihi na ayi arapuwo Jehova, we fè Bealim na Ashtarot òfùfè: ma ub͕u a naputa ayi n'aka ndi-iro-ayi, ayi gēfè kwa Gi òfùfè.

11. Jehova we zite Jerubeal, na Bedan, na Jefta, na Samuel, we naputa unu n'aka ndi-iro-unu buruburu, unu we biri na ntukwasi-obi.

12. Unu we hu na Nehash, bú eze umu Amom, biara imegide unu, unu we sim, É-è, kama otù eze gāburu ayi eze: ma Jehova, bú Chineke-unu, bu eze-unu.

13. Ma ub͕u a le eze nke unu rọputaworo, onye unu riọrọm n'aka: ma, le, Jehova emewo ka eze nāchi unu.

14. Ọ buru na unu atua egwu Jehova, ọ buru kwa na unu efè Ya òfùfè, we ge nti olu-Ya, ọ buru kwa na unu anupughi isi n'okwu-ọnu Jehova, kama na unu nēsogide Jehova, bú Chineke-unu, ma unu onwe-unu ma eze-unu kwa nke bu eze-unu, ọ di nma:

15. ma ọ buru na unu egeghi nti olu Jehova, kama unu nānupu isi n'okwu-ọnu Jehova, aka Jehova gādi kwa imegide unu, otú ọ di imegide nna-unu-hà.

16. Ub͕u a kwa guzonu onwe-unu, hu ihe uku a, nke Jehova nēme n'anya-unu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Samuel 12