Mb͕e Jekob batara n'Ijipt, mb͕e nna-unu-hà tikuru Jehova nkpu, Jehova we zite Moses na Eron, ndi mere ka nna-unu-hà si n'Ijipt puta, me kwa ka ha biri n'ebe a.