Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi-Eze 8:43-57 Bible Nso (IGBOB)

43. Gi onwe-gi nuru kwa n'elu-igwe, bú ọnọdu obibi-Gi guzosiri ike, me dika ihe nile si di nke onye ala ọzọ ahu nākpọku Gi; ka ndi nile nke uwa we mara aha-Gi, itu egwu Gi, dika ndi-Gi, bú Israel, si eme, na imara na akpọkwasiri aha-Gi n'ulo a nke m'wuworo.

44. Mb͕e ndi-Gi gāpu ibuso onye-iro-ha agha, n'uzọ ọ bula I gēziga ha, ha we kpere Jehova n'uzọ obodo ahu nke I rọputaworo, na n'ebe ulo a di nke m'wuworo aha-Gi:

45. Gi nuru kwa n'elu-igwe ekpere-ha na aririọ-amara-ha, mezie ikpé-ha.

46. Mb͕e ha gēmehie megide Gi, (n'ihi na ọ dighi madu ọ bula nke nādighi-emehie,) I we wesa ha iwe, rara ha nye n'iru onye-iro-ha, ndi nādọta ha n'agha ewe dọta ha n'agha je n'ala onye-iro, n'ebe di anya ma-ọbu n'ebe di nso;

47. ha we chegharia n'obi-ha n'ala ebe adọtara ha n'agha, we chigharia, riọ Gi amara n'ala ndi nādọta ha n'agha, si, Ayi emehiewo, me ajọ omume, mebie iwu-Gi;

48. ọ buru kwa na ha ewere obi-ha nile, were kwa nkpuru-obi-ha nile, laghachikute Gi n'ala ndi-iro-ha, bú ndi dọtara ha n'agha, ha ewe kpere Gi n'uzọ ala-ha, nke I nyere ndi bu nna-ha, na obodo ahu nke I rọputaworo, na ulo nke m'wuworo aha-Gi:

49. Gi nuru kwa n'elu-igwe, bú ọnọdu obibi-Gi guzosiri ike, ekpere-ha na aririọ-amara-ha, mezie ikpé-ha;

50. Gi b͕aghara kwa ndi-Gi ndi mehieworo megide Gi, na njehie-ha nile nke ha jehieworo megide Gi; Gi nye kwa ha ka enwe obi-ebere n'aru ha n'iru ndi nādọta ha n'agha, ka ha we nwe obi-ebere n'aru ha:

51. n'ihi na ndi-Gi na ihe-nketa-Gi ka ha bu, ndi I mere ka ha si n'ala Ijipt, n'etiti oké ọku ígwè ahu, puta:

52. ka anya-Gi abua we nāsaghe n'aririọ-amara orù-Gi, na n'aririọ-amara ndi-Gi, bú Israel, ige nti ha na nkpọku nile ha nākpọku Gi.

53. N'ihi na Gi onwe-gi kewaputara ha n'etiti ndi nile nke uwa, iburu Gi ihe-nketa, dika I kwuru n'aka Moses, bú orù-Gi, mb͕e I mere ka nna-ayi-hà si n'Ijipt puta, Onye-nwe-ayi, bú Jehova.

54. O rue, mb͕e Solomon kpebìri ekpere a nile na aririọ-amara a nile nye Jehova, na o siri n'iru ebe-ichu-àjà Jehova bilie, site n'ib͕u ikperè-ya abua n'ala, site kwa n'ime ka aka-ya abua b͕asa n'ebe elu-igwe di.

55. O we guzo, were oké olu gọzie nkpọkọta nile nke Israel, si,

56. Onye agọziri agọzi ka Jehova bu, Onye nyeworo ndi-Ya, bú Israel, izu-ike, dika ihe nile nke O kwuru si di: ọ dighi otù okwu dapuru n'okwu-Ya nile di nma, nke O kwuru n'aka Moses, bú orù-Ya.

57. Ka Jehova, bú Chineke-ayi, nọyere ayi, dika Ọ nọyere nna-ayi-hà: ka Ọ ghara irapu ayi, ka Ọ ghara kwa ib͕anari ayi:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi-Eze 8