Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi-Eze 5:8-18 Bible Nso (IGBOB)

8. Hairam we zigara Solomon ozi, si, Anuwom ozi nke i ziterem: mu onwem gēme ihe nile nātọ gi utọ bayere osisi cedar, baye-kwa-ra osisi fir.

9. Ndi-orùm gēsi na Lebanon buputa ha oké osimiri: mu onwem gāb͕a kwa ha ka ha se n'elu oké osimiri rue ebe ahu nke i gēziterem ozi, m'gātọsa kwa ha n'ebe ahu, gi onwe-gi gēburu kwa ha: gi onwe-gi gēme kwa ihe nātọm utọ, n'inye ulom nri.

10. Hairam we nēnye Solomon osisi cedar na osisi fir, bú ka ihe nile nātọ ya utọ ra.

11. Solomon we nye Hairam orú nnù ọtùtù ọka uzọ abua na nnù iri nke ọka wheat iburu ulo-ya ihe-oriri, na orú ọtùtù cor nke manu asuru asu: otú a ka Solomon nēnye Hairam kwa-arọ.

12. Jehova nye-kwa-ra Solomon amam-ihe, dika Ọ gwara ya; udo we di n'etiti Hairam na Solomon; ha abua we b͕a ndu.

13. Eze, bú Solomon, we weputa usu ndi nēfè òfùfè n'Israel nile; usu ahu ndi nēfè òfùfè bu orú nnù ndikom uzọ atọ na nnù iri-na-ise.

14. O ziga ha na Lebanon, orú nnù ndikom na nnù ise n'ọnwa na nb͕anwe: otù ọnwa ka ha nọ na Lebanon, ọnwa abua n'ulo: Adonairam bu kwa onye-isi usu ndi nēfè òfùfè.

15. Solomon nwe-kwa-ra orú nnù ndikom uzọ asatọ na nnù iri-na-ise ndi nēbu ibu, na orù nnù ndikom uzọ iri ndi nāwa ihe-ọwuwa n'ugwu;

16. nāgughi ndi-isi nke ndi edoro ndi-isi, bú ndi Solomon nwere, ndi bu isi n'ije-ozi ahu, nnù ndikom asatọ na ọgu ise, ndi nwere ike n'aru ndi ahu ndi nālu ọlu n'ije-ozi ahu.

17. Eze we nye iwu, ha we bute nkume uku, nkume di oké ọnu-ahia, iwere nkume awaputara awaputa tọ ntọ-ala ulo ahu.

18. Ndi-owu-ulo nke Solomon na ndi-owu-ulo nke Hairam na ndi Gebal we, dozie osisi na nkume iwu ulo ahu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi-Eze 5