Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi-Eze 2:33-41 Bible Nso (IGBOB)

33. Ọbara-ha gālaghachi kwa n'isi Joab, na n'isi nkpuru-ya rue mb͕e ebighi-ebi: ma udo gādiri Devid, di-kwa-ra nkpuru-ya, di-kwa-ra ulo-ya, di-kwa-ra oche-eze-ya, rue mb͕e ebighi-ebi, site na Jehova.

34. Benaia nwa Jehoiada we rigo, dakwasi ya, me ka ọ nwua; ewe lìe ya n'ulo-ya n'ọzara.

35. Eze we tiye Benaia nwa Jehoiada n'ọnọdu-ya ka ọ buru onye-isi usu-ndi-agha: Zedok, bú onye-nchu-àjà, ka eze tiyere n'ọnọdu Abaiata.

36. Eze we ziga kpọ Shimai, si ya, Wuere onwe-gi ulo na Jerusalem, biri n'ebe ahu, esi-kwa-la n'ebe ahu pua je ebe ọ bula.

37. O gēru kwa, n'ubọchi i gāpu, gabiga miri-iyi Kidron, na i gāmara nke-ọma na i ghaghi inwu: ọbara-gi gādi n'isi-gi.

38. Shimai we si eze, Okwu a di nma: dika onye-nwem, bú eze, kwuworo, otú a ka orù-gi gēme. Shimai we biri na Jerusalem ọtutu ubọchi.

39. O rue, n'ọgwugwu arọ atọ, na ndi-orù abua Shimai nwere b͕akuru Ekish, nwa Meaka, eze Gat. Ha we gosi Shimai, si, Le, ndi-orù-gi nọ na Gat.

40. Shimai we bilie, jikwa inyinya-ibu-ya, jerue Gat, jekuru Ekish, ichọ ndi-orù-ya: Shimai we je, me ka ndi-orù ya si na Gat biaghachi.

41. Ewe gosi Solomon na Shimai esiwo na Jerusalem je rue Gat, lata kwa.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi-Eze 2