Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi-Eze 2:24-33 Bible Nso (IGBOB)

24. Ma ub͕u a Jehova nādi ndu, Onye meworo ka m'guzosie ike, O me kwa ka m'nọkwasi n'oche-eze Devid, bú nnam, Jehova Onye mewo-kwa-ram ulo, dika O kwuru, n'ezie agēme ka Adonaija nwua ta.

25. Eze, bú Solomon, we zìe ozi n'aka Benaia nwa Jehoiada; o we dakwasi ya, o we nwua.

26. Eze we si Abaiata, bú onye-nchu-àjà, La n'Anatot, rue ubi-gi; n'ihi na nwoke kwesiri ọnwu ka i bu: ma m'gaghi-eme ka i nwua n'ubọchi ta, n'ihi na i būru ib͕e Onye-nwe-ayi Jehova n'iru Devid, bú nnam, na n'ihi na ewedara gi n'ala n'ihe nile nke ewedara nnam n'ala nime ya.

27. Solomon we chupu Abaiata ka ọ ghara iburu Jehova onye-nchu-àjà; ka o we me ka okwu Jehova rè, bú nke O kwuru bayere ulo Ilai nime Shailo.

28. Akukọ ahu we rue Joab nti: n'ihi na Joab wezugara onwe-ya iso Adonaija n'azu, ọ bu ezie na o wezugaghi onwe-ya iso Absalom n'azu. Joab we b͕alaga n'Ulo-ikwū Jehova, jide mpi ebe-ichu-àjà.

29. Ewe gosi eze, bú Solomon, si, Joab ab͕alagawo n'Ulo-ikwū Jehova, ma, le, ọ nọ n'akuku ebe-ichu-àjà. Solomon we ziga Benaia nwa Jehoiada, si, Je, dakwasi ya.

30. Benaia we biarue Ulo-ikwū Jehova, si ya, Otú a ka eze siri, Puta. Ọ si, É-è; kama n'ebe a ka m'gānwu. Benaia we weghachiri eze okwu, si, Otú a ka Joab kwuru, ọ bu kwa otú a ka ọ zaram.

31. Eze we si ya, Me dika o kwuworo, dakwasi ya, lì kwa ya; ka i we si n'ebe m'nọ na n'ebe ulo nnam nọ wezuga ọbara awusiri n'efu, nke Joab wusiri.

32. Jehova gēme kwa ka ọbara-ya laghachi n'isi-ya, n'ihi na ọ dakwasiri ndikom abua bu ndi ezi omume na ndi di nma kari ya, o were mma-agha b͕ue ha, ma nnam, bú Devid, amaghi ya, bú Abnea nwa Nea, onye-isi usu-ndi-agha Israel, na Amasa nwa Jeta, onye-isi usu-ndi-agha Juda.

33. Ọbara-ha gālaghachi kwa n'isi Joab, na n'isi nkpuru-ya rue mb͕e ebighi-ebi: ma udo gādiri Devid, di-kwa-ra nkpuru-ya, di-kwa-ra ulo-ya, di-kwa-ra oche-eze-ya, rue mb͕e ebighi-ebi, site na Jehova.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi-Eze 2