Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi-Eze 16:4-24 Bible Nso (IGBOB)

4. Onye nke Beasha nke nwuru anwu n'obodo, nkita gēri ya; onye nke ya nke nwuru anwu n'ọhia, anu-ufe nke elu-igwe gēri kwa ya.

5. Ma okwu Beasha nile nke fọduru, na ihe o mere, na idi-ike-ya, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel?

6. Beasha we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya na Tiaza; Ila, bú nwa-ya, we buru eze n'ọnọdu ya.

7. Ọzọ kwa, n'aka Jihu, bú nwa Hanani, onye-amuma, ka okwu Jehova biara imegide Beasha, na imegide ulo-ya, ma n'ihi ihe ọjọ nile nke o mere n'anya Jehova, iwere omume aka-ya kpasue Ya iwe, n'idi ka ulo Jeroboam; ma n'ihi na o tib͕uru ya.

8. N'arọ nke-orú-na-isi nke Esa, bú eze Juda, ka Ila nwa Beasha malitere ibu eze Israel nime Tiaza, arọ abua.

9. Orù-ya Zimri, bú onye-isi nkera ub͕ọ-ala-ya, we kekọta madu imegide ya: ma ya onwe-ya nọ na Tiaza, nāṅu manya nāṅubiga ya okè n'ulo Aza, onye bu onye-isi ulo-ya na Tiaza:

10. Zimri we ba, tib͕ue ya, me ka ọ nwua, n'arọ nke-orú-na-asa nke Esa, bú eze Juda, o we buru eze n'ọnọdu ya.

11. O rue, mb͕e ọ malitere ibu eze, mb͕e ọ nọkwasiri n'oche-eze-ya, na o tib͕uru ulo Beasha nile: o kweghi ka otù nwa-nwoke fọduru ya, ma ọ bu nime ndi-ikwu-ya, ma-ọbu nime ndi-eyì-ya.

12. Zimri we kpochapu ulo Beasha nile, dika okwu Jehova si di, nke O kwuru megide Beasha n'aka Jihu, bú onye-amuma,

13. bayere nmehie nile nke Beasha, na nmehie nile nke Ila, bú nwa-ya, nke ha mehiere, na nke ha ji me Israel mehie, iwere ihe-efu nile ha kpasue Jehova, bú Chineke Israel, iwe.

14. Ma okwu Ila nile nke fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel?

15. N'arọ nke-orú-na-asa nke Esa, bú eze Juda, ka Zimri bu eze ubọchi asa na Tiaza. Ma ndi Israel nọ n'ọmuma-ulo-ikwū imegide Gibeton, nke diri ndi Filistia.

16. Ndi nọ n'ọmuma-ulo-ikwū we nu, si, Zimri ekekọtawo madu, ọzọ kwa, o tib͕uwo eze: Israel nile we me Ọmri, bú onye-isi usu-ndi-agha, ka ọ buru eze Israel n'ubọchi ahu n'ọmuma-ulo-ikwū.

17. Ọmri we si na Gibeton rigo, ya na Israel nile, ha we nọchigide Tiaza n'agha.

18. O rue, mb͕e Zimri huru na ewerewo obodo, na ọ bara n'ulo-elu nke ulo eze, sure ulo eze n'ọku n'isi onwe-ya, nwua,

19. n'ihi nmehie-ya nile nke ọ mehiere, n'ime ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, n'ije ije n'uzọ Jeroboam, na nime nmehie nke o mere, ime ka Israel mehie.

20. Ma okwu Zimri nile nke fọduru, na nkekọta nke ọ kekọtara madu imegide eze, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel?

21. Mb͕e ahu ekewara ndi Israel na nkera abua: otù nkera ndi Israel soro Tibni, bú nwa Ginat, ime ya ka ọ buru eze; nkera ọzọ soro Ọmri.

22. Ndi soro Ọmri we di ike kari ndi soro Tibni, bú nwa Ginat: Tibni we nwua, Ọmri we buru eze.

23. N'arọ nke-orú-na-iri-na-otù nke Esa, bú eze Juda, ka Ọmri malitere ibu eze Israel, arọ iri na abua: ọ bu eze na Tiaza arọ isi.

24. Ọ zuru ugwu Sameria n'aka Shema na talent ọla-ọcha abua; o wue ulo n'ugwu ahu, kpọ aha obodo ahu o wuru Sameria, n'aha Shema, bú onye-nwe ugwu ahu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi-Eze 16