Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi-Eze 16:19-34 Bible Nso (IGBOB)

19. n'ihi nmehie-ya nile nke ọ mehiere, n'ime ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, n'ije ije n'uzọ Jeroboam, na nime nmehie nke o mere, ime ka Israel mehie.

20. Ma okwu Zimri nile nke fọduru, na nkekọta nke ọ kekọtara madu imegide eze, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel?

21. Mb͕e ahu ekewara ndi Israel na nkera abua: otù nkera ndi Israel soro Tibni, bú nwa Ginat, ime ya ka ọ buru eze; nkera ọzọ soro Ọmri.

22. Ndi soro Ọmri we di ike kari ndi soro Tibni, bú nwa Ginat: Tibni we nwua, Ọmri we buru eze.

23. N'arọ nke-orú-na-iri-na-otù nke Esa, bú eze Juda, ka Ọmri malitere ibu eze Israel, arọ iri na abua: ọ bu eze na Tiaza arọ isi.

24. Ọ zuru ugwu Sameria n'aka Shema na talent ọla-ọcha abua; o wue ulo n'ugwu ahu, kpọ aha obodo ahu o wuru Sameria, n'aha Shema, bú onye-nwe ugwu ahu.

25. Ọmri mere ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, me kwa ihe ọjọ kari ndi nile buru ya uzọ.

26. Ọ je ije n'uzọ nile nke Jeroboam, bú nwa Nebat, na nime nmehie-ya nile nke o jiri me ka Israel mehie, iwere ihe-efu nile ha kpasue Jehova, bú Chineke Israel, iwe.

27. Ma ihe Ọmri nile nke fọduru, bú nke o mere, na ihe idi-ike-ya nke o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel?

28. Ọmri we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya na Sameria: Ehab, bú nwa-ya, we buru eze n'ọnọdu ya.

29. Ma n'arọ nke-orú-na-iri-na-asatọ nke Esa, bú eze Juda, ka Ehab, bú nwa Ọmri, malitere ibu eze Israel: Ehab nwa Ọmri we buru eze Israel nime Sameria orú arọ na abua.

30. Ehab nwa Ọmri mere ihe jọrọ njọ n'anya Jehova kari ndi nile buru ya uzọ.

31. O rue, dika agāsi na ọ bu ihe nfe na ọ nējeghari na nmehie nile nke Jeroboam, bú nwa Nebat, na ọ luru Jezebel na nwunye, bú nwa-nwayi Etbeal eze ndi Zaidon, ọ we je fè Beal òfùfè, kpọ kwa isi ala nye ya.

32. O we me ka ebe-ichu-àjà guzoro Beal n'ulo Beal, nke o wuru na Sameria.

33. Ehab me-kwa-ra Ashera; Ehab we me ihe ọzọ ikpasu Jehova, bú Chineke Israel, iwe, kari ndi-eze nile nke Israel ndi buru ya uzọ.

34. N'ubọchi-ya ka Hiel, bú onye Bet-el, wuru Jeriko: Abairam, bú ọkpara-ya, ka o were tọ ntọ-ala-ya; Segub, bú nwa-ya nwoke nke-ntà ka ọ were kwa guzo ọnu-uzọ-ama-ya ọtọ; dika okwu Jehova si di, nke O kwuru n'aka Joshua nwa Nun.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi-Eze 16