Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi-Eze 16:18-30 Bible Nso (IGBOB)

18. O rue, mb͕e Zimri huru na ewerewo obodo, na ọ bara n'ulo-elu nke ulo eze, sure ulo eze n'ọku n'isi onwe-ya, nwua,

19. n'ihi nmehie-ya nile nke ọ mehiere, n'ime ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, n'ije ije n'uzọ Jeroboam, na nime nmehie nke o mere, ime ka Israel mehie.

20. Ma okwu Zimri nile nke fọduru, na nkekọta nke ọ kekọtara madu imegide eze, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel?

21. Mb͕e ahu ekewara ndi Israel na nkera abua: otù nkera ndi Israel soro Tibni, bú nwa Ginat, ime ya ka ọ buru eze; nkera ọzọ soro Ọmri.

22. Ndi soro Ọmri we di ike kari ndi soro Tibni, bú nwa Ginat: Tibni we nwua, Ọmri we buru eze.

23. N'arọ nke-orú-na-iri-na-otù nke Esa, bú eze Juda, ka Ọmri malitere ibu eze Israel, arọ iri na abua: ọ bu eze na Tiaza arọ isi.

24. Ọ zuru ugwu Sameria n'aka Shema na talent ọla-ọcha abua; o wue ulo n'ugwu ahu, kpọ aha obodo ahu o wuru Sameria, n'aha Shema, bú onye-nwe ugwu ahu.

25. Ọmri mere ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, me kwa ihe ọjọ kari ndi nile buru ya uzọ.

26. Ọ je ije n'uzọ nile nke Jeroboam, bú nwa Nebat, na nime nmehie-ya nile nke o jiri me ka Israel mehie, iwere ihe-efu nile ha kpasue Jehova, bú Chineke Israel, iwe.

27. Ma ihe Ọmri nile nke fọduru, bú nke o mere, na ihe idi-ike-ya nke o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel?

28. Ọmri we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya na Sameria: Ehab, bú nwa-ya, we buru eze n'ọnọdu ya.

29. Ma n'arọ nke-orú-na-iri-na-asatọ nke Esa, bú eze Juda, ka Ehab, bú nwa Ọmri, malitere ibu eze Israel: Ehab nwa Ọmri we buru eze Israel nime Sameria orú arọ na abua.

30. Ehab nwa Ọmri mere ihe jọrọ njọ n'anya Jehova kari ndi nile buru ya uzọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi-Eze 16