Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi-Eze 11:18-31 Bible Nso (IGBOB)

18. Ha we si na Midian bilie, biarue Peran: ha we si na Peran chiri ndikom tiyere onwe-ha, bata n'Ijipt, biakute Fero, bú eze Ijipt; o we nye ya ulo, si ka enye ya nri, o nye-kwa-ra ya ala.

19. Hedad we huta amara n'iru Fero nke-uku, o we nye ya nwa-nne nwunye-ya na nwunye, bú nwa-nne Tahpenes nwunye eze.

20. Nwa-nne Tahpenes we muara ya Genubat, bú nwa-ya nwoke, onye Tahpenes mere ka ọ rapu ara n'etiti ulo Fero: Genubat we nọ n'ulo Fero n'etiti umu-ndikom Fero.

21. Ma Hedad nuru n'Ijipt na Devid soro nna-ya-hà dina n'ọnwu, na Joab, bú onye-isi usu-ndi-agha, anwuwo kwa, Hedad we si Fero, Zilagam, ka m'we la n'alam.

22. Fero we si ya, Ma gini nākọ gi onwe-gi n'ebe m'nọ, na, le, i nācho ila n'ala-gi? Ọ si, Ọ dighi ihe kọrọm: otú ọ di, zilagam nọ̄.

23. Chineke we me ka onye-nmegide ọzọ biliere ya, bú Rezon nwa Eliada, onye b͕anariri Hedadeza eze Zoba, bú onye-nwe-ya:

24. ọ chikọta ndikom n'ebe ọ nọ, ghọ onye-isi usu ndi nāpunara madu ihe, mb͕e Devid buru ndi Zoba: ha we jerue Damaskọs, biri nime ya, buru eze na Damaskọs.

25. Ọ we ghọrọ Israel onye-nmegide ubọchi nile nke Solomon, tiyere ihe ọjọ nke Hedad mere: ike Israel we gwusia ya, o we buru eze Siria.

26. Ma Jeroboam nwa Nebat, onye Efrata nke Zerida, bu orù Solomon nwere, aha nne-ya bu Zerua, nwayi di-ya nwuru, o weli-kwa-ra aka-ya megide eze.

27. Ma nka bu ihe kpatara o ji welie aka-ya megide eze: Solomon wuru Milo, mechie ntipú obodo Devid, bú nna-ya.

28. Nwoke ahu, bú Jeroboam, bu dike nke bu dìnkpà: Solomon we hu nwa-okorọbia ahu, na onye nēje ozi nke-ọma ka ọ bu, o we me ya ka ọ buru onye-nlekọta ibū nile nke ulo Josef.

29. O rue, na mb͕e ahu, na Jeroboam siri na Jerusalem pua, onye-amuma, bú Ahaija, bú onye Shailo, we chọta ya n'uzọ; ma Ahaija nēwere uwe ọhu yikwasi n'aru-ya; ha abua nọ kwa iche, nání ha, n'ọhia.

30. Ahaija we jide uwe ọhu ahu nke di n'aru ya, dọwa ya na ndọwa iri na abua.

31. Ọ si Jeroboam, Chiri n'onwe-gi ndọwa iri: n'ihi na otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Le, M'nādọwapu ala-eze a n'aka Solomon, M'gēnye kwa gi ebo iri:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi-Eze 11