Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi-Eze 10:4-13 Bible Nso (IGBOB)

4. Eze-nwayi Sheba we hu amam-ihe nile nke Solomon, na ulo nke o wuru,

5. na ihe-oriri nke table-ya, na nnọdu nke ndi-orù-ya, na nguzo nke ndi nējere ya ozi, na uwe-ha, na ndi-obu-ihe-ọṅuṅu-ya, na àjà-nsure-ọku-ya nke ọ nēsure n'ulo Jehova; mọ adighi kwa nime ya ọzọ.

6. O we si eze, Ezi-okwu ka okwu ahu bu nke m'nuru n'alam bayere okwu-gi nile, baye-kwa-ra amam-ihe-gi.

7. Ma ekweghm okwu ahu, rue mb͕e m'biara, anyam abua we hu ya: ma, le, egosighm nkera-ya: i tukwasiwo amam-ihe na idi-nma n'akukọ nke m'nuru.

8. Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndikom-i bu, ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi-orù-gi ndia bu, ndi nēguzo n'iru gi mb͕e nile, ndi nānu amam-ihe-gi.

9. Ka Jehova, bú Chineke-gi, buru onye agọziri agọzi, Onye ihe-gi tọrọ Ya utọ, itiyekwasi gi n'oche-eze Israel: ọ bu n'ihi na Jehova huru Israel n'anya rue mb͕e ebighi-ebi ka O doro gi eze, ime ihe ekpere n'ikpe na ezi omume.

10. O nye eze ọgu talent ọla-edo isi, na uda di iche iche bara uba nke-uku, na nkume di oké ọnu-ahia: ọ dighi uda biara ọzọ nke di ka uda ahu n'iba-uba, bú nke eze-nwayi Sheba nyere eze, bú Solomon.

11. Ọzọ kwa, ub͕ọ Hairam, nke siri n'Ofia bute ọla-edo, ha siri n'Ofia bubata osisi almug bara uba nke-uku, na nkume di oké ọnu-ahia.

12. Eze we were osisi almug ahu mere ulo Jehova, me-kwa-ra ulo eze, ihe-ndabere, ọ were kwa ha mere ndi nābù abù ubọ-akwara na une: osisi almug di otú a abiaghi, ahughi kwa ha, rue ta.

13. Eze, bú Solomon, nye-kwa-ra eze-nwayi Sheba ihe nile nātọ ya utọ, ihe ọ bula ọ riọrọ, nāgughi ihe o nyere ya dika aka eze, bú Solomon, si di. O we chigharia la n'ala-ya, ya onwe-ya na ndi-orù-ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi-Eze 10