Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi-Eze 10:23-27 Bible Nso (IGBOB)

23. Eze, bú Solomon, we di uku kari eze nile nke uwa n'àkù na n'amam-ihe.

24. Uwa nile we nāchọ iru Solomon, inu amam-ihe-ya, nke Chineke tiyere n'obi-ya.

25. Ndi ahu nēbute kwa, nwoke ọ bula onyinye-inata-iru-ọma-ya, ihe ọla-ọcha, na ihe ọla-edo, na uwe, na ihe-ekike-agha, na uda di iche iche, na inyinya, na inyinya mule, ihe anēnye n'arọ n'arọ-ya.

26. Solomon we chikọta ub͕ọ-ala na ndi-inyinya: o we nwe nnù ub͕ọ-ala atọ na ọgu iri, na orú nnù ndi-inyinya na nnù iri, ọ we do ha n'obodo ub͕ọ-ala, na n'ebe eze nọ na Jerusalem.

27. Eze we me ọla-ọcha ka ọ di ka nkume na Jerusalem, ọ me-kwa-ra osisi cedar ka ha di ka osisi sycomore nke di n'ebe di ala n'uba.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi-Eze 10